1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'ubọ-akwara. Maschil Devid: mb͕e ndi Zif biara, si Sọl, Devid, ọ̄ dighi-ezo onwe-ya n'etiti ayi? Chineke, were aha-Gi zọputam, Were kwa idi-ike-Gi kpem ikpe.
2Chineke, nuru ekperem; Ṅa nti n'okwu nile nke ọnum.
3N'ihi na ndi ala ọzọ ebiliwo imegidem, Ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim: Ha edoghi Chineke n'iru ha.
3Selah
4Le, Chineke bu onye nēyerem aka: Onye-nwe-ayi nọ n'etiti ndi nākwagide nkpuru-obim.
5Ọ gēnyeghachi ndi nēchem anwu ihe ọjọ ha: Were ezi-okwu-Gi kpochapu ha.
6M'gēji onyinye-afọ-ofufo churu Gi àjà: M'gēkele aha-Gi, Jehova, n'ihi na ọ di nma.
7N'ihi na ọ bu na nkpab͕u nile ka Ọ naputaworom; Anyam elekwasiwo kwa ndi-irom.