1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Jonath elem rehokim. Abù Ọma nke Devid: Michtam: mb͕e ndi Filistia jidere ya na Gat. Merem amara, Chineke; n'ihi na madu ekusiwo ume ike ilom: Ogologo ubọchi nile ka o nēbu agha nēmeb͕um.
2Ndi nēchem anwu nēkusi ume ike ilom ogologo ubọchi nile: N'ihi na ha bara uba bú ndi nēbu agha imegidem n'ibuli onwe-ha elu.
3N'ubọchi m'nātu egwu, Mu onwem, ọ bu Gi ka m'gātukwasi obi.
4Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya: Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu; Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem?
5Ogologo ubọchi nile ka ha nāhighari okwum nile: N'imegidem èchìchè nile ha bu ime ihe ọjọ.
6Ha nēzukọ, nēzobe onwe-ha, Ndi ahu nēlezi ikiri-ukwum abua anya, Dika ha leworo anya nkpuru-obim.
7Ọ̀ bu n'ihi ajọ ihe ka ha nāb͕apu? N'iwu-Gi me ka ndi nile di iche iche rida, Chineke.
8Nwagharim ka Gi onwe-gi guworo ọnu: Tiye anya-mirim nile nime karama-akpukpọ-Gi; Hà adighi n'akwukwọ-Gi:
9Mb͕e ahu ndi-irom gālaghachi azu n'ubọchi m'gākpọku Gi: Nka ka m'mara, na Chineke dirim.
10Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya: Nime Jehova ka m'gēto okwu-Ya.
11Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu; Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem?
12N'isim, Chineke, ka nkwa nile m'kwere Gi di: M'gākwughachi Gi ekele nile.
13N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu: Ì naputaghi ukwum abua na nnuda anēnudam? Ka m'we nējeghari n'iru Chineke N'ihè ndi ndu.