1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù: Al-tashheth. Abù Ọma nke Devid: Michtam: mb͕e ọ b͕apuru n'iru Sọl ba n'ọb͕à.Merem amara, Chineke, merem amara;N'ihi na nime Gi ka nkpuru-obim b͕abàworo:Ọ bu kwa na ǹdò nke nkù-Gi abua ka m'gāb͕abà,Rue mb͕e ihe-ila-n'iyì ndia gāgabiga.
2M'gākpọku Chineke Onye kachasi ihe nile elu;M'gākpọku Chineke Onye nēmezurum ihe.
3O gēsi n'elu-igwe zìe, zọputam,Mb͕e onye nēkusi ume ike ilom nāta uta; Chineke gēziputa ebere-Ya na ezi-okwu-Ya.
3Selah
4Nkpuru-obim nọ n'etiti ọdum;M'gēdina n'etiti ndi nēre ọku,Bú umu madu, ndi ezé nile ha bu ube na àkú,Ire-ha bu kwa mma-agha di nkọ.
5Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke;Ka ebube-Gi di elu n'elu uwa nile.
5
6Ub͕u ka ha doziworo nzọ-ukwum nile;Nkpuru-obim erudawo n'ala:Ha egwuwo olùlù n'irum;Ha adabàwo n'etiti ya.
6Selah
7Edoziwo obim Chineke, edoziwo obim:M'gābù abù, e, m'gābù abù ọma.
8Teta, nsọpurum; teta, une na ubọ-akwara:M'gākpọte chi-ọbubọ.
9M'gēkeli gi n'etiti ndi nile di iche iche, Onye-nwe-ayi:M'gābùku Gi abù ọma n'etiti mba nile.
10N'ihi na ebere-Gi di uku rue elu-igwe,Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé.
11Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke;Ka ebube-Gi di n'elu uwa nile.