ABÙ ỌMA 58:1-11 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Al-tashheth. Abù Ọma nke Devid: Michtam. Ọ̀ bu ezie na ezi omume nke kwesiri ka unu kwue bu ob͕i? Ùnu ji izi-ezi kpe ikpe, unu umu madu?

2É-è, kama ọ bu nime obi ka unu nēme ajọ omume nile; Unu nātùzi ihe-ike nke aka-unu n'uwa.

3Emewo ka ndi nēmebi iwu buru ndi ala ọzọ site n'àkpà-nwa: Ha akpafuwo site n'afọ nne-ha, nēkwu okwu-ugha.

4Edide ha nwere yiri edide agwọ: Ha di ka aju-ala nke nti chiri nke nākpọchi nti-ya;

5Nke nādighi-ege nti olu nke ndi nārà agwọ, Ma-ọbu nke dibia nārafu arafu, bú onye emeworo ka ọ mara ihe.

6Chineke, tijie ezé nile ha n'ọnu-ha: Tikwopu ezé uku nile nke umu-ọdum, Jehova.

7Ka ha b͕aze dika miri nke nērùghariri onwe-ya: Mb͕e o nēdo àkú-ya nile, ka ha di ka anēbipu ọnu-ha.

8Ka ha di ka ejula nāga nāb͕aze, Dika nwa nwanyi mukworo amukwo, dika ndi ọ dighi mb͕e ha huru anyanwu.

9Tutu ite-unu amata ọku ogwu, Ma ihe di ndu ma ihe di ọku, Ọ nēfepusi ha ike dika oké ifufe.

10Onye ezi omume gāṅuri mb͕e ọ huru ọ́bọ̀ ahu: Ọ gāsa nzọ-ukwu-ya nile n'ọbara onye nēmebi iwu.

11Madu gāsi kwa, N'ezie nkpuru diri onye ezi omume: N'ezie Chineke di Nke nēkpe ikpe n'uwa.

>