1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Shushan Eduth: Michtam Devid, izí ihe: mb͕e ọ lusoro Eram-naharaim, luso kwa Eram-zoba, ọ̀gù, Joab we laghachi, tib͕ue Edom nime Ndagwurugwu Nnú, orú nnù madu na nnù iri. Chineke, I juwo ayi aju, I tiwawo ayi, I wewo iwe; I gēme ka ayi laghachi ọzọ.
2I mewo ka ala ma jijiji; I b͕awawo ya: Mezie ntiwa-ya nile; n'ihi na o mewo nkpatu.
3I mewo ka ndi-Gi hu ihe siri ike: I mewo ka ayi ṅua manya nke isu-ngọngọ.
4I nyewo ndi nātu egwu Gi ọkọlọtọ, Ka ewe welie ya elu dika ọkọlọtọ n'ihi ezi-okwu.
4Selah
5Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya, Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi.
6Chineke ekwuwo okwu n'di-nsọ-Ya; ka m'ṅuria ọṅu-agha: M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot.
7Mu nwe Gilead, ọ bu kwa mu nwe Manase; Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim; Juda bu nkpa-n'aka-ezem.
8Moab bu ite ọsisa-arum; N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum: Filistia, tie nkpu n'ihim.
9Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike? Ònye duruworom rue Edom?
10Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke, juworo ayi aju? I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha ayi, Chineke.
11Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u: N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu.
12Nime Chineke ayi ga-eme ihe dìnkpà: Ọ bu kwa Ya onwe-ya gāzọda ndi nākpab͕u ayi