ABÙ ỌMA 61:1-8 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu ubọ-akwara. Abù Ọma nke Devid. Chineke, nuru olu iti-nkpum; Ṅa nti ekperem.

2M'nēsi na nsọtu uwa kpọkue Gi, mb͕e, obim nādighi ike: Rue n'oké nkume nke kam elu ka I gēdurum je.

3N'ihi na I buworom ebe-nb͕abà, Ulo-elu di ike ipu n'iru onye-iro.

4Ka m'nọ dika ọbìa n'ulo-ikwū-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi: M'gāb͕abà n'ebe-nzuzo nke nkù-Gi abua.

4Selah

5N'ihi na Gi onwe-gi, Chineke, egewo nti nkwa nile m'kwere: I werewo ihe-nnweta nke ndi nātu egwu aha-Gi nye ha.

6I gātukwasi ọtutu ubọchi n'ubọchi ndu eze: Arọ-ya nile gādi ka ọtutu ọb͕ọ.

7O gēbi n'iru Chineke rue mb͕e ebighi-ebi: Wezuga ebere na ezi-okwu, ka ha we nēchezi ya.

8Otú a m'gābùku aha-Gi abù ọma rue mb͕e ebighi-ebi, Ka m'we kwughachi nkwam nile kwa-ubọchi.