1Abù Ọma Devid, mb͕e ọ nọ n'ọzara Juda. Chineke, ọ bu Chinekem ka I bu; anamachọsi Gi ike: Akpiri Gi akpọwo nkpuru-obim nku, anu-arum achọsiwo Gi ike, N'ala ọkpọ-nku na nke ida-#mbà, ebe miri nādighi.
2Otú a ka m'lekwasiworo Gi anya n'ebe nsọ gi, Ihu ike-Gi na nsọpuru-Gi.
3N'ihi na ebere-Gi di nma kari ndu; Eb͕ub͕ere-ọnum abua gāja Gi.
4Otú a ka m'gāgọzi Gi mb͕e m na-ādi ndu: N'aha-Gi ka m'gāchili akam elu.
5Afọ nēju nkpuru-obim dika agāsi na o rijuru umi-anu na abuba afọ; Ọ bu kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēti nkpu ọṅù ka ọnum nēji to Gi;
6Ọ buru na echetam I n'elu utem, Nime nche-abali nile ka m'nātughari uchem na Gi.
7N'ihi na I buworom iye-aka, Ọ bu kwa n'okpuru ǹdò nke nkù-Gi abua ka m'nēti nkpu ọṅù.
8Nkpuru-obim nārapara Gi n'aru n'iso Gi n'azu: Mu ka aka-nri-gi jideworo.
9Ma ndi ahu, ọ bu ime ka ọ la n'iyì ka ha nāchọ nkpuru-obim, Ha gābà n'ebe nile di ala nke uwa.
10Agarara ha nye n'aka mma-agha: Òkè nke nkita-ọhia ka ha gābu.
11Ma eze gāṅuri na Chineke: Onye ọ bula nke nēwere Ya ṅu iyi gānya isi; N'ihi na agēkpuchi ọnu nke ndi nēkwu okwu-ugha.