ABÙ ỌMA 64:1-10 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid. Chineke, nuru olum n'itughari-uchem: Nēchezi ndum ka ọ pua n'oké egwu nke onye-iro.

2I gēzopum n'ìzù nzuzo nke ndi nēme ihe ọjọ: N'ìgwè ndi nālu ajọ ihe:

3Ndi muworo ire-ha dika mma-agha, Ha edowo àkú-ha, bú okwu di ilu:

4Ib͕a onye zuru okè àkú n'ebe nzuzo di iche iche: Na mberede ka ha nāb͕a ya, ha adighi-atu kwa egwu.

5Ha nēme okwu ọjọ ka ọ diri ha ike; Ha nākọ akukọ bayere isi ọnyà na nzuzo; Ha siri, Ònye gāhu ha?

6Ha nāchọputa ajọ omume nile, si, Ayi emezuwo nchọputa achọputara nke-ọma: Ọzọ, èchìchè-ime nke madu ọ bula nime ha na obi-ya miri emi.

7Ma Chineke nāb͕a ha àkú; Na mberede ka ntib͕u nile ha bu.

8Ewe me ka ha su ngọngọ, ebe ire nke aka ha nēmegide ha: Ha nēfufe isi, bú onye ọ bula nke nēlekwasi ha anya.

9Madu nile gātu kwa egwu; We gosi ọlu Chineke, Were uche chè èchìchè bayere omume-Ya.

10Onye ezi omume gāṅuri na Jehova, b͕abà kwa nime Ya; Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gānya kwa isi.

>