1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid. Chineke, nuru olum n'itughari-uchem: Nēchezi ndum ka ọ pua n'oké egwu nke onye-iro.
2I gēzopum n'ìzù nzuzo nke ndi nēme ihe ọjọ: N'ìgwè ndi nālu ajọ ihe:
3Ndi muworo ire-ha dika mma-agha, Ha edowo àkú-ha, bú okwu di ilu:
4Ib͕a onye zuru okè àkú n'ebe nzuzo di iche iche: Na mberede ka ha nāb͕a ya, ha adighi-atu kwa egwu.
5Ha nēme okwu ọjọ ka ọ diri ha ike; Ha nākọ akukọ bayere isi ọnyà na nzuzo; Ha siri, Ònye gāhu ha?
6Ha nāchọputa ajọ omume nile, si, Ayi emezuwo nchọputa achọputara nke-ọma: Ọzọ, èchìchè-ime nke madu ọ bula nime ha na obi-ya miri emi.
7Ma Chineke nāb͕a ha àkú; Na mberede ka ntib͕u nile ha bu.
8Ewe me ka ha su ngọngọ, ebe ire nke aka ha nēmegide ha: Ha nēfufe isi, bú onye ọ bula nke nēlekwasi ha anya.
9Madu nile gātu kwa egwu; We gosi ọlu Chineke, Were uche chè èchìchè bayere omume-Ya.
10Onye ezi omume gāṅuri na Jehova, b͕abà kwa nime Ya; Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gānya kwa isi.