1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù, bú Abú Ọma. Tikusienu Chineke nkpu ọǹù ike, uwa nile:
2Bùanu nsọpuru aha-Ya n'abù ọma: Menu ka otuto-Ya di nsọpuru.
3Sinu Chineke, Le ka ọlu-Gi nile si di oké egwu! N'uba nke ike-Gi ndi-iro-Gi gērube isi aghugho n'okpuru Gi.
4Uwa nile gākpọ isi ala nye Gi, Bùku kwa Gi abù ọma; Ha gābùku aha-Gi abù ọma.
4Selah
5Jenu, hu ọlu nile nke Chineke; Onye di egwu ka Ọ bu n'omume-Ya n'ebe umu madu nọ.
6Ọ b͕anwere oké osimiri ka ọ ghọ ala-akọrọ: Ha nāgabiga osimirí n'ukwu-ha: Ka ayi ṅuria nime Ya n'ebe ahu.
7O ji idi-ike-Ya achi rue mb͕e ebighi-ebi; Anya-Ya abua nēche mba nile nche: Ka ndi nēwezuga onwe-ha ghara ibuli onwe-ha elu.
7Selah
8Gọzienu Chineke-ayi, unu ndi nile di iche iche, Me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya:
9Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu, Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n'ọnọdu-ha.
10N'ihi na I nwawo ayi, Chineke: I nuchawo ayi, dika esi anucha ọla-ọcha.
11I mere ka ayi ma n'ọnyà; I tukwasiwo n'úkwù-ayi ibu nānyib͕u ayi.
12I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n'elu isi-ayi; Ayi bàra n'ọku na nime miri; I we me ka ayi puta ba n'inwebiga-ihe-ókè.
13M'gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n'ulo-Gi, M'gākwughachi Gi nkwam nile m'kwere Gi,
14Nke eb͕ub͕ere-ọnum abua ji saghepu, Nke ọnum kwu-kwa-ra, mb͕e nkpà dirim.
15Ọtutu àjà-nsure-ọku, bú anu nwere abuba, ka m'gēsurere Gi, Ha na ihe-nsure-ọku nke nēsì ísì utọ nke ebulu; M'gāchu oke-ehi n'àjà, ha na nkpi.
15Selah
16Bianu, nuru, unu nile ndi nātu egwu Chineke, M'gākọ kwa akukọ bayere ihe O meworo nkpuru-obim.
17Ya ka m'jiri ọnum kpọkue, Nbuli-elu di kwa n'okpuru irem.
18Ọ buru na ọ bu ajọ ihe ka m'leworo anya nime obim, Onye-nwe-ayi agaghi-anu olum:
19N'ezie Chineke anuwo olum; Ọ ṅawo nti olu ekerem.
20Onye agọziri agọzi ka Chineke bu, Onye nēwezugaghi ekperem, O sighi kwa n'ebe m'no wezuga ebere-Ya.