ABÙ ỌMA 67:1-7 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'ubọ-akwara. Abù Ọma, Abù. Ka Chineke mere ayi amara, gọzie ayi, Me ka iru-Ya mua n'ebe ayi nọ; Selah

2Ka ewe mara uzọ-Gi n'uwa, Mara nzọputa-Gi n'etiti mba nile.

3Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke; Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.

4Ka mba nile ṅuria, ti kwa nkpu ọṅù: N'ihi na I gēkpe ndi nile n'uwa ikpe ziri ezi, Mba nile n'uwa ka I gēdu kwa.

4Selah

5Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke; Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.

6Ala emewo ihe-ọmume-ya: Chineke, bú Chineke-ayi, gāgọzi ayi.

7Chineke gāgọzi ayi; Nsọtu nile nke uwa gātu kwa egwu Ya.