1Shiggaion nke Devid, nke ọ bùkuru Hehova, bayere okwu Kush, bú onye Benjamin. Jehova, bú Chinekem, na Gi ka m'b͕abàworo: Zọputam n'aka ndi nile nēsob͕um, naputakwam n'aka-ha:
2Ka ọ ghara idọka nkpuru-obim dika ọdum, Nētipia ya, mb͕e onye-nnaputa adighi.
3Jehova, bú Chinekem, ọ buru na emewom nka; Ọ buru na ajọ omume di n'ọbu-akam abua;
4Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n'udo ihe ọjọ; (Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n'efu:)
5Ka onye-iro chua mkpuru-obim, rue ya aru; Ka ọ zọda kwa ndum n'ala, Me ka nsọpurum biri n'ájá.
5Selah
6Bilie, Jehova, n'iwe-Gi, Welie Onwe-gi elu imegide nrubiga-ókè-iwe nke ndi nākpab͕um: Teta-kwa-ram; I nyewo ikpé iwu.
7Ka nzukọ nke ndi nile di n'uwa di kwa Gi buruburu: Gi laghachi kwa n'ebe di elu n'elu ya.
8Jehova nēkpe ndi nile di iche iche ikpe: Kpem ikpe, Jehova, dika ezi omumem si di, na dika izu-okèm si di nke di nimem.
9Biko, kwe ka ihe ọjọ nke ndi nēmebi iwu gwusia, ma me ka onye ezi omume guzosie ike: N'ihi na onye nānwa obi nile na akuru nile ka Chineke, bú Onye ezi omume, bu.
10Ọtam dikwasi na Chineke, Bú Onye nāzọputa ndi obi-ha ziri ezi.
11Chineke bu onye-ikpe nēme ezi omume, Ọ bu kwa Chineke nke nēwe iwe kwa-ubọchi.
12Ọ buru na madu echigharighi, Ọ gāmu mma-agha-Ya ka ọ di nkọ; Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, dozie ya ib͕a.
13Ọ bu kwa imegide ya ka O doziworo ihe nile nke ọnwu; Ọ nēme àkú-Ya ka ha buru ihe nēre ọku.
14Le, ime ajọ ihe nēme ya; Ọ turuwo kwa ime nmeb͕u, muputa okwu-ugha.
15Olùlù ka o gwuworo, gwuputa ya, O we da n'ebe-nbibi nke ọ nēme.
16Nmeb͕u-ya gābiaghachi n'isi-ya, Ọ bu kwa n'opu-n'isi-ya ka ihe-ike-ya gāridakwasi.
17M'gēkele Jehova dika ezi omume-Ya si di: M'gābùku kwa aha Jehova, bu Onye kachasi ihe nile elu, abù ọma.