ABÙ ỌMA 70:1-5 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke Devid; ime ka echeta. Chineke, bia ọsọsọ inaputam; Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka.

2Ka ihere me ha, ka ha nwe kwa iru-ihere, Bú ndi nāchọ nkpuru-obim: Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.

3Ka ha laghachi azu n'ihi ihere-ha, Bú ndi nāsi, Ehe, ehe!

4Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi; E, ka ndi nāhu nzọputa-Gi n'anya nāsi mb͕e nile, Ka Chineke di uku.

5Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na ob͕eye; Chineke, biakutem ọsọsọ: Onye-iye-akam na Onye nēme ka m'b͕apu ka I bu; Jehova, anọla ọdù.