1Nime Gi, Jehova, ka m'b͕abàworo: Ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi.
2N'ezi omume-Gi naputam, me ka m'b͕apu: Tọrọm nti-Gi n'ala, zọputam.
3Ghọrọm oké nkume nke ebe-obibi, nke m'gābà nime ya mb͕e nile I nyewo iwu izọputam; N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu.
4Chinekem, me ka m'b͕apu n'aka onye nēmebi iwu, N'ọbu-aka nke onye nēme ajọ omume nke nēme kwa ihe-ike.
5N'ihi na Gi onwe-gi bu olile-anyam, Onye-nwe-ayi Jehova: Gi bu ntukwasi-obim site na nwata.
6N'elu Gi ka m'dabeworo site n'afọ nnem: Gi onwe-gi bu onye weputaworom n'afọ nnem: Na Gi ka otutom gādi mb͕e nile.
7Aghọworom ọtutu madu ihe-ebube; Ma Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm di ike.
8Ọnum gējuputa n'otuto-Gi, Ogologo ubọchi nile ka ọ gējuputa kwa n'ima-nma-Gi.
9Etufulam na mb͕e agadi; Mb͕e ikem gwusiri arapulam.
10N'ihi na ndi-irom ekwuwo okwu bayerem; Ọzọ, ndi nēche nkpuru-obim nche ab͕aritawo ìzù,
11Si, Chineke arapuwo ya: Chuanu ya, jide ya; n'ihi na ọ dighi onye-nnaputa di.
12Chineke, anọlam ebe di anya: Chinekem, bia ọsọsọ iyerem aka.
13Ka ihere me ha, ka eme kwa ka ha gwusia, bú ndi nēmegide nkpuru-obim; Ka ewere ita-uta na ọnọdu-ihere kpuchie ndi nāchọ imem ihe ọjọ.
14Ma mu onwem, mb͕e nile ka m'ganēche Gi, We tukwasi otuto n'otuto-gi nile
15Ọnum gākọ akukọ bayere ezi omume-Gi, Ogologo ubọchi nile ka ọ gākọ akukọ bayere nzọputa-Gi; N'ihi na amaghm ọnu-ọgugu nile ha.
16M'gēji idi-ike nile nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, bia: M'gēhota ezi omume-Gi, nání nke Gi.
17Chineke, I zíwom ihe site na nwata; Ọ bu kwa rue ub͕u a ka m'nēgosi oké ọlu-Gi nile.
18Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke; Rue mb͕e m'gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-Gi Gosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi.
19Ọzọ, ezi omume-Gi, Chineke, nādiru ebe di elu; Gi Onye meworo ihe uku di iche iche, Chineke, ònye di ka Gi?
20Gi, Onye meworo ka ayi hu ọtutu nkpab͕u nke jọ-kwa-ra njọ, I gēme ka ayi di kwa ndu ọzọ, Me kwa ka ayi si n'ob͕u-miri nile nke uwa rigoputa ọzọ.
21Me ka idi-ukum bakari uba, Gi chighari kwa kasiem obi.
22Mu onwem gēji kwa une kele Gi, Bú ezi-okwu-Gi, Chinekem: M'gēji ubọ-akwara bùkue Gi abù ọma, Gi Onye Nsọ nke Israel.
23Eb͕ub͕ere-ọnum abua gēti nkpu ọṅù mb͕e m'nābùku Gi abù ọma; Nkpuru-obim, nke I b͕aputaworo, gēti kwa nkpu ọṅù.
24Ọzọ, irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi ogologo ubọchi nile: N'ihi na ihere emewo ha, n'ihi na ha nwere iru-ihere, bú ndi nāchọ imem ihe ọjọ.