ABÙ ỌMA 73:1-28 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma Esaf. N'ezie Chineke di nma n'ebe Israel nọ, Bú n'ebe ndi di ọcha n'obi nọ.

2Ma mu onwem, ọ fọduru nwantī ka ukwum abua wezuga onwe-ha; Nzọ-ukwum fọduru nke-ntà ka ha b͕uchapu.

3N'ihi na ekwosorom ndi nānya isi ekworo, Ọ bu udo nke ndi nēmebi iwu ka m'nāhu.

4N'ihi na ọ dighi nmekpa-aru ọ bula di n'ọnwu-ha: Ma aru-ha mara abuba.

5Ha anọghi n'ahuhu madu ọzọ; Adighi-eti kwa ha ihe-otiti n'etiti madu nile.

6N'ihi nka npako di ha buruburu dika iyab͕a-olu; Anēwere ime-ihe-ike kpuchie ha dika uwe.

7Anya-ha esiwo n'abuba-ha guzoputa: Ntughari nile nke obi-ha agabigawo ókè.

8Ha nākwa emò, nēkwu kwa okwu nmeb͕u n'ihe ọjọ: Ha nēsi n'ebe di elu kwu okwu.

9Ha edowo ọnu-ha n'elu-igwe, Ire-ha nējeghari kwa n'uwa.

10N'ihi nka ndi-Ya nālata n'ebe a, Ha nāmiputa-kwa-ra onwe-ha miri gēju afọ.

11Ha we si, Chìneke si aṅa mara? Ọ̀ di kwa ọmuma-ihe di n'Onye kachasi ihe nile elu?

12Le, ndia bu ndi nēmebi iwu; Ọzọ, ebe ha nānọgide n'udo mb͕e ebighi-ebi, ha emewo ka àkù-ha bùkari ibù.

13Ọ bu nání n'efu ka m'meworo ka obim di ọcha, N'efu ka m'kwọworo ọbu-akam abua n'emeghi-ihe-ọjọ;

14Buru kwa onye anēti ihe ogologo ubọchi nile, Onye iba-nbam di kwa-n'ututu.

15Ọ buru na asiwom, M'gākọ akukọ otú a; Le, ọ bu ọb͕ọ nke umu-Gi ka m'gāghọb͕uwori.

16M'we chè èchìchè imata nka, Ndọb͕u-onwem-n'ọlu ka ọ bu n'anyam;

17Rue mb͕e m'nābà n'ebe nsọ nile nke Chineke, Ghọta ikpe-azu-ha.

18N'ezie ọ bu n'ebe nile nālọ alọ ka I nēdo ha: I mewo ka ha darue ntikpọ.

19Hà siri aṅa ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu n'otù ntabi-anya? Ha agwuwo gwusia site n'ihe-egwu di iche iche.

20Dika nrọ mb͕e madu nēteta n'ura; Otú a, Onye-nwe-ayi, mb͕e I gākpọte Onwe-gi, I gēleda onyinyo-ha anya.

21N'ihi na obim nāb͕ari uka, Ọ nādutukwam ogwu n'akurum abua.

22Ma mu onwem bu anu-ọhia, amaghkwam ihe; Nání anu ka m'buworo n'iru Gi.

23Ma mu onwem nọ n'aka-Gi mb͕e nile: I jidewo aka-nrim.

24I gēji ndum-ọdu-Gi nēdum, Emesia I gēji kwa nsọpuru naram.

25Ọ̀nye k m'nwere n'elu-igwe ma-ọbughi Gi? Ma-ọbughi Gi ọ dighi onye ihe-ya tọworom utọ n'uwa.

26Anu-arum na obim agwusiwo: Oké nkume nke obim na òkèm ka Chineke bu rue mb͕e ebighi-ebi.

27N'ihi na, le, ndi nọ gi n'ebe di anya gāla n'iyì: I kpochapuwo onye ọ bula nke nāpu n'aka-Gi akwa iko.

28Ma mu onwem, ibiaru Chineke nso dim nma: Edowom ebe-nb͕abàm n'Onye-nwe-ayi, bú Jehova, Ka m'we kọ akukọ bayere ije-ozi-Gi nile.

>