ABÙ ỌMA 76:1-12 IGBOB1970 - Bible AI

1Abu Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'ubọ-akwara. Abù Ọma Esaf, Abù. Onye amaworo na Juda ka Chineke bu: N'Israel ka aha-Ya di uku.

2Ọ bu kwa na Selem ka ulo-ntu-Ya di Ebe-obibi-Ya di kwa na Zaion.

3N'ebe ahu ka Ọ b͕ajiri àkú nile nēb͕u àmùmà nke uta; Na ọta, na mma āgha, na agha.

3Selah

4Onye juputara n'ihè ka I bu, I di ebube, nēsite n'ugwu nile nke anu adọb͕uru.

5Akwatawo ihe ndi nwere obi ike n'agha, ha atuwo òrù-ura-ha; Ha achọtaghi kwa aka-ha, bú ndi nile bu dìnkpà.

6Site n'ibasi-nba-ike nke Gi, Chineke nke Jekob, Ma ub͕ọ-ala ma inyinya adawo n'oké ura.

7Gi onwe-gi, Onye anātu egwu ka I bu: Ọzọ, ònye gēguzo n'iru Gi site na mb͕e I were iwe?

8I siri n'elu-igwe me ka anuru okwu ikpé; Uwa turu egwu, we di jū,

9Mb͕e Chineke biliri ikpe ikpe, Izọputa ndi nile di ume-ala n'obi nke uwa.

9Selah

10N'ihi na ọnuma madu gēkele Gi: I gēji ọnuma nile nke fọduru ke n'úkwù.

11Kwenu nkwa, kwughachi kwa Jehova, bú Chineke-unu: Ka ndi nile ndi nọ Ya buruburu bukue onye ahu di egwu abu.

12Ọ nēb͕ochi mọ ndi-ndú: Ọ bu onye anātu egwu n'ebe ndi-eze uwa nọ.

>