ABÙ ỌMA 78:1-72 IGBOB1970 - Bible AI

1Maschil Esaf. Ndim, ǹanu nti n'iwum: Tọnu nti n'ala inu okwu nile nke ọnum.

2M'gāsaghe ọnum n'itu ilu: M'gēkwuwa okwu-omimi di iche iche n'uba, bú nke sitere na mb͕e ochie:

3Nke ayi nuworo mara kwa, Nke nna-ayi-hà kọwo-kwa-ra ayi.

4Ayi agaghi-ezonari ha na nti umu-ha, Nākọrọ ọb͕ọ nke gādi n'iru akukọ otuto nile nke Jehova, Na ike-Ya, na oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo.

5O we me ka otù ihe-àmà guzosie ike nime Jekob, O do-kwa-ra iwu n'Israel, Nke O nyere nna-ayi-hà n'iwu, Ime ka umu-ha mara ha:

6Ka ọb͕ọ nke gādi n'iru we mara, bú umu agāmu; Ha gēbili, we kọro umu-ha akukọ ahu:

7Ka ha we tukwasi obi-ha na Chineke, Ghara ichezọ omume nile nke Chineke, Ma debe ihe nile O nyere n'iwu:

8Ghara kwa idi ka ndi bu nna-ha, Ndi bu ọb͕ọ nēwezuga onwe-ha nke nānupu kwa isi; Ọb͕ọ ndi nēdozighi obi-ha, Ndi mọ-ha nēkwesighi ntukwasi-obi n'ebe Chineke nọ.

9Umu Efraim, ọ bu ezie na ha nāchi ihe-agha nēbuli kwa uta, Ma ha chighariri n'ubọchi agha.

10Ha edebeghi ọb͕ub͕a-ndu Chineke, Ma ha juru ijeghari n'iwu-Ya;

11Ha we chezọ omume-Ya nile, Na oké ọlu-Ya nile nke O mere ka ha hu.

12N'iru ndi bu nna-ha ka Ọ luru oké ọlu, N'ala Ijipt, n'ọhia Zoan.

13O kewara oké osimiri, we me ka ha gabiga; O me-kwa-ra ka miri guzo ọtọ dika obo-ihe.

14O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie, Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.

15Ọ nākpọwa oké nkume di iche iche n'ọzara, We me ka ha ṅua miri ri nne dika o si nime ob͕u-miri puta.

16O me-kwa-ra ka miri nke nērù erù si na nkume di elu puta, O we me ka miri nērùda dika ọtutu osimiri.

17Ma ha nọ nēmehie kwa ọzọ imegide Ya, Inupu isi n'okpuru Onye kachasi ihe nile elu n'ala kpọro nku.

18Ha we nwa Chineke n'obi-ha N'iriọ ihe-oriri nye ọchichọ-nkpuru-obi-ha.

19Ha we kwue okwu megide Chineke; Ha siri, Chineke, Ọ̀ puru ido table n'usoro n'ọzara?

20Le, O tiri oké nkume ihe, miri we nērù erù, Isi-iyi di iche iche nērubiga kwa ókè; Ọ̀ di kwa achicha Ọ puru inye? Ọ̀ gēdoziri ndi-Ya anu?

21N'ihi nke Jehova nuru, O we webiga iwe ókè: Ewe kponwue ọku megide Jekob, Ọzọ kwa, iwe kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide Israel;

22N'ihi na ha ekweghi na Chineke, Ha atukwasighi kwa obi-ha na nzọputa-Ya.

23O we nye mbara-ígwé nile n'elu iwu, Meghe kwa ọnu-uzọ nile nke elu-igwe;

24O we me ka manna zokwasi ha dika miri, ka ha rie, Ọ bu kwa ọka nke elu-igwe ka O nyere ha.

25Nri nke ndi di ike ka madu riri: O zitere ha ihe ha gēriju afọ.

26O nēme ka ifufe Iru-anyanwu bulie ije n'elu-igwe: O ji-kwa-ra ike-Ya duru ifufe Ndida.

27O we me ka anu zokwasi ha dika ájá, Ọbuná dika ájá oké osimiri, bú anu-ufe nwere nkù:

28O we me ka ọ da n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-ha, Buruburu ebe-obibi-ha nile.

29Ha we rie, afọ we ju ha nke-uku; Ọ bu kwa ihe ha nāchọsi ike ka Ọ nēme ka ọ biarue ha aru.

30Ha abughi ndi ala ọzọ n'ebe ihe ha nāchọsi ike di, Ihe-oriri-ha nādi ha n'ọnu,

31Mb͕e iwe Chineke kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide ha, We b͕ue ufọdu n'etiti ndi-ha nke mara abuba, Ọ bu kwa umu-okorọbia nke Israel ka o mere ka ha ruru ala.

32N'ihe a nile ha mehie-kwa-ara ọzọ, Ha ekweghi kwa n'oké ọlu-Ya nile.

33O we me ka ubọchi nile ha gwusia n'otù nku-ume, O me-kwa-ra ka arọ nile ha gwusia n'obi-ọlulọ-miri.

34Ọ buru na O b͕uru ha, ha we chọ Ya: Laghachi kwa, chọsie Chineke ike.

35Ha we cheta na Chineke bu oké nkume-ha, Cheta kwa na Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu Onye-nb͕aputa-ha.

36Ha we ji ọnu-ha nārà Ya, Ji kwa ire-ha nāgwa Ya okwu-ugha.

37Obi-ha eguzosighi kwa ike n'ebe Ọ nọ, Ha ekwesighi kwa ntukwasi-obi n'ọb͕ub͕a-ndu-Ya.

38Ma Ya onwe-ya, ebe O nwere obi-ebere, Ọ nēkpuchi ajọ omume-ha, Ọ dighi-ebibi kwa ha: E, ọtutu mb͕e ka O mere iwe-Ya ka ọ laghachi azu, Ọ dighi-akpọte kwa ọnuma-Ya nile.

39O we cheta na anu-aru ka ha bu; Ifufe nke nālafe alafe, we ghara ilaghachi.

40Ùb͕ò ole ka ha nānupu isi n'okpuru Ya n'ọzara? Ùb͕ò ole ka ha nēme ka o wuta Ya n'ala tọb͕ọrọ n'efu?

41Ha we chigharia, we nwa Chineke, Ọ bu kwa Onye nsọ nke Israel ka ha kpasuru iwe.

42Ha echetaghi aka-Ya, Ubọchi mb͕e Ọ b͕aputara ha n'aka onye-nkpab͕u.

43Otú O tiyere ihe-iriba-ama-Ya nile n'Ijipt, Tiye kwa ihe-ebube-Ya nile n'ọhia Zoan;

44O we b͕anwe osimiri Nail nile ha ka ha ghọ ọbara, Ha adighi-aṅu kwa miri-ha nērù erù.

45Ọ nēzite odudu n'etiti ha, nke nātab͕u ha; Ọ nēzite kwa awo, nke nēbibi ha.

46Ọ nye-kwa-ra ọbubu ihe-omume-ha, Nye kwa igurube ihe ha dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inweta.

47O nēji ákú-miri-ígwé b͕u osisi vine nile ha, Ji kwa frost b͕u osisi sycomore nile ha.

48O mechibido-kwa-ra anumanu-ha nye ákú-miri-ígwé, Mechibido kwa anu-ulo nile ha nye àmùmà di ọku.

49Ọ nēzite ọnuma nke iwe-Ya n'etiti ha, Nrubiga-ókè-iwe, na iwe, na nkpab͕u, Bú ozìzì nke ndi-mọ-ozi nke ihe ọjọ.

50Ọ nēme ka uzọ di lari bayere iwe-Ya; O b͕ochighi nkpuru-obi-ha n'inwu ọnwu, Kama O mechibidoro ndu-ha nye ajọ ọria nēfe efe;

51O we tib͕ue nwa ọ bula eburu uzọ mu n'Ijipt, Bú nkpuru mbu nke ume-ha n'ulo-ikwū nile nke Ham:

52O we me ka ndi-Ya bulie ije dika ìgwè ewu na aturu, Ọ nēdu kwa ha n'ozara dika ìgwè aturu.

53O we nēdu ha n'ikwesi-ntukwasi-obi, ha atughi kwa oké egwu: Ma ndi-iro-ha, oké osimiri kpuchiri ha.

54O we me ka ha biarue ókè-ala nsọ Ya, Rue ugwu a nke aka-nri-Ya nwetara.

55Ọ chupu-kwa-ra mba nile n'iru ha, We me ka ala ha barue ndi ya aka n'ala nketa e ji údò tua, O we me ka ebo nile nke Israel biri n'ulo-ikwū-ha.

56Ma ha nwara Chineke Nke kachasi ihe nile elu, ha we nupu isi n'okpuru Ya, Ha edebeghi kwa ihe-àmà-Ya nile;

57Kama ha laghachiri azu, we ghọb͕ue nghọb͕u dika ndi bu nna-ha: Ha riri mpe dika uta nāghọ aghughọ.

58Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe, Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo.

59Chineke nuru nka, O we webiga iwe ókè, Jusie Israel ike:

60O we rapu ebe-obibi nke Shailo, Bú ulo-ikwū nke O mere ka o biri n'etiti madu;

61O we were ike-Ya nye ka adọta ya n'agha, Were kwa ima-nma-Ya nye n'aka onye-nkpab͕u.

62O mechibido-kwa-ra ndi-Ya nye n'aka mma-agha; Ọ bu kwa ihe-nketa-Ya ka O webigara iwe-ókè megide.

63Ọku ripiara umu-okorọbia-ha; Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di.

64Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha; Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.

65Onye-nwe-ayi we teta dika onye nāraru ura, Dika dike nke nēti nkpu nke-uku site na manya-vine.

66O we tib͕ue ndi-nkpab͕u-Ya n'azu: Ita-uta ebighi-ebi ka O nyere ha.

67Ọzọ, Ọ juru ulo-ikwū nke Josef, Ọ bughi kwa ebo Efraim ka Ọ rọputara;

68Kama Ọ rọputara ebo Juda, Rọputa ugwu Zaion, nke Ọ huru n'anya.

69O we wue ebe nsọ Ya dika ebe di elu, Dika uwa nke Ọ tọrọ ntọ-ala-ya rue mb͕e ebighi-ebi.

70Ọ rọputa-kwa-ara Devid, bú orù-Ya, O we si n'ogige ìgwè ewu na aturu kuru ya:

71O mere ka o si n'iso nne-aturu nke nēnye umu-ha ara bia, Izù Jekob, bú ndi-Ya, na Israel, bú ihe-nketa-Ya, dika aturu.

72O we nāzù ha dika izu-okè nke obi-ya si di; Were kwa ihe-nghọta nile nke ọbu-aka-ya abua nēdu ha.

>