ABÙ ỌMA 8:1-9 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Gittith. Abù Ọma Devid. Jehova, Onye-nwe-ayi, Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile! Gi Onye tiyeworo ebube-Gi n'elu ígwé.

2I siwo n'ọnu umu-ntakiri na umu nāṅu ara tọ ntọ-ala ike, N'ihi ndi-nkpab͕u-Gi, Ime ka onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀ kwusi.

3Mb͕e m'huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi, Ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo;

4Gini ka madu bu, na I nēcheta ya; Na nwa nke madu, na I nēleta ya?

5I we me ya ka ọ fọduru ya nke-ntà ibu Chineke, I ji kwa nsọpuru na ima-nma kpube ya n'isi dika okpu-eze.

6I nēme ya ka ọ nāchi ọlu nile nke aka-Gi abua; Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua:

7Ewu na aturu na ehi, ha nile, Ha na anu ọhia;

8Nnunu elu-igwe, na azù nile nke oké osimiri, Bú ihe nke nāgabiga n'uzọ nile nke oké osimiri nile.

9Jehova, Onye-nwe-ayi, Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile!

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
/div>