ABÙ ỌMA 81:1-16 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Gittith. Abù Ọma nke Esaf. Tikuenu Chineke, bú ike-ayi, nkpu ọṅụ: Tikusienu Chineke nke Jekob nkpu ọṅụ ike.

2Bulienu abù ọma, weta kwa egwú-otiti, Na ubọ-akwara di utọ, ya na une.

3Fùanu opì-ike n'ọnwa ọhu, N'ọnwa ndọzu, n'ubọchi ememe-ayi.

4N'ihi na ukpuru enyere Israel ka ọ bu, Ọ bu ikpe Chineke nke Jekob kpere.

5Ihe-àmà nime Josef ka O doro ya, Mb͕e Ọ putara imegide ala Ijipt: Ọ bu okwu-ọnu nke otù onye m'nāmaghi ka m'nānu.

6Ewezugaram ubu-ya n'ibu: Ọbu-aka-ya abua nēsi n'abọ gabiga.

7Na nkpab͕u i kpọkurum, M'we naputa gi; Anamaza gi n'ebe-nzuzo nke éb͕è-elu-igwe; Anamanwa gi n'akuku miri Meriba.

7Selah

8Nuru, ndim, M'gāb͕a àmà megide gi: Israel, ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na i gēgem nti!

9Ọ dighi chi ala ọzọ gādi nime gi; I gaghi-akpọ kwa isi ala nye chi mba ọzọ.

10Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, Nke nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa: Meghe ọnu-gi ka ọ sa mbara, M'gēmeju kwa ya.

11Ma ndim egeghi nti olum; Israel ekweghikwam.

12M'we zilaga ha n'isi-ike nke obi-ha, Ka ha we nējeghari na ndum-ọdu nile ha.

13Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndim ganēgem nti, Ma asi na Israel gēje ije n'uzọm nile!

14Nwa mb͕e ka M'gēji me ka ndi-iro-ha ruru ala, Ọ bu kwa imegide ndi nākpab͕u ha ka M'gēchighari akam.

15Ndi nākpọ Jehova asi gērube isi aghughọ n'okpuru Ya: Ma mb͕e-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi.

16Ọ gēme kwa ka ha rie abuba ọka wheat: Ọ bu kwa manu-aṅu nke sitere n'oké nkume ka M'gēji nyeju gi afọ.

>