ABÙ ỌMA 82:1-8 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma Esaf. Chineke nēguzo Onwe-ya nime nzukọ Chineke; N'etiti chi nile ka Ọ nēkpe ikpe.

2Rùe ole mb͕e ka unu gēkpe ikpe ajọ omume? Rù kwa ole mb͕e ka unu gāhu ndi nēmebi iwu iru-ọma?

3Kpenu onye nēnweghi ike na nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi: Guanu onye ewedara n'ala na onye nọ na nkpà n'onye ezi omume.

4Menu ka onye nēnweghi ike na ob͕eye b͕apu: Naputanu ha n'aka ndi nēmebi iwu.

5Ha amaghi, ha aghọtaghi kwa; N'ọchichiri ka ha nējeghari: Ewezugawo ntọ-ala nile nke uwa n'ọnọdu-ha.

6Mu onwem siri, Chi ka unu bu, Ọ bu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu ka unu bu.

7Otú ọ di, dika madu ka unu gānwu, Ọ bu kwa dika otù nime ndi-isi ka unu gādà.

8Bilie, Chineke, kpe uwa ikpe: N'ihi na Gi onwe-gi gēketa ihe, bú mba nile.