ABÙ ỌMA 87:1-7 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma umu Kora; Abù. Ntọ-ala-Ya di n'ugwu nsọ nile.

2Jehova nāhu ọnu-uzọ-ama nile nke Zaion Kari ebe-obibi nile nke Jekob.

3Ihe di iche iche nke di nsọpuru ka anēkwu bayere gi, Obodo Chineke.

3Selah

4M'gēhota Rehab na Babilon, na ha di n'etiti ndi maram: Le Filistia na Taia, ha na Etiopia; Nka ka amuru n'ebe ahu.

5Ọ bu kwa Zaion ka agēkwu okwu bayere ya, si, Onye na onye ọ bula ka amuru nime ya; Ọzọ, Ya onwe-ya, bú Onye kachasi ihe nile elu, gēme ka o guzosie ike.

6Jehova gāgu, mb͕e O ji de ndi nile di iche iche n'akwukwọ, si, Nka ka amuru n'ebe ahu.

6Selah

7Ma ndi nābù abù ma ndi nēte egwú, ha nile gāsi, Isi-iyim nile di na Gi.