ABÙ ỌMA 88:1-18 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù, bú Abù Ọma Umu Kora; nke diri Onye-isi Abù; n'elu Mahalath Leannoth. Maschil Himan, bú onye-Ezrahait. Jehova, Chineke nke nzọputam, N'ehihie ka m'tiworo nkpu, n'abali kwa, n'iru Gi:

2Kwe ka ekperem bata n'iru Gi; Tọ nti-Gi n'ala n'iti-nkpum:

3N'ihi na afọ ihe ọjọ di iche iche ejuwo nkpuru-obim, Ndum abiaruwo kwa nso ala-mọ.

4Aguwom na ndi nārida n'olùlù; Aghọwom onye di ka nwoke nēnweghi ike:

5Anọm n'etiti ndi nwuru anwu, buru onye nwere onwe-ya, Dika ndi eb͕uru eb͕u ndi nēdina n'ílì, Ndi I nēchetaghi ọzọ; Ndi ahu bu kwa ndi ebipuworo n'aka-Gi.

6I tọb͕ọwom n'olùlù dichasi ala, N'ebe di iche iche b͕ara ọchichiri, nime miri di omimi.

7Ọnuma-Gi akwagidewom, I werewo kwa ebili-miri-Gi nile wedam n'ala.

7Selah

8I mewo ka ndi m'mara nke-ọma nọm n'ebe di anya; I mewom ka m'ghọrọ ha ihe-árú: Abum onye eb͕ochiworo, adighm-apu kwa n'èzí.

9Anyam adalawo n'isi site na nweda-n'ala: Jehova, akpọkuwom I kwa-ubọchi, Ab͕asawom ọbu-akam abua n'ebe I nọ.

10Ọ̀ bu ndi nwuru anwu ka I gāluru oké ọlu? Ndi nādighi ndu, hà gēbili kele Gi?

10Selah

11Àgākọ akukọ ebere-Gi n'ílì? Àgākọ akukọ ikwesi-ntukwasi-obi-Gi n'ebe-ila-n'iyì?

12Àgāmara oké ọlu-Gi n'ọchichiri? Àgāma kwa ezi omume-Gi n'ala nchezọ-ihe?

13Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tikuworo, Jehova, Ọ bu kwa n'ututu ka ekperem gēje izute Gi.

14Jehova, n'ìhi gini ka I nāju nkpuru-obim? N'ìhi gini ka I nēzonarim iru-Gi?

15Onye ewedara n'ala na onye nēkubi ume ka m'bu site na nwata: Eburuwom oké ujọ Gi nile, obim nālọ miri.

16Iwe-Gi di ọku agabigawo n'isim; Ihe-egwu-Gi nile ekpochapusiwom.

17Ha dim buruburu dika miri ogologo ubọchi nile; Ha ab͕awom buruburu n'otù.

18I mewo ka onye nāhum n'anya na eyìm nọm n'ebe di anya, Ndi m'mara nke-ọma ka ọchichiri bu.

>