ABÙ ỌMA 9:1-20 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Muth-labben. Abù Ọma Devid. M'gēji obim nile kele Jehova; M'gākọ kwa akukọ oké ọlu-Gi nile.

2M'gāṅuri ọṅu, obim gātọkwam utọ, nime Gi: M'gābùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu;

3Mb͕e ndi-irom laghachiri azu, Su ngọngọ, si kwa n'iru Gi la n'iyì.

4N'ihi na I kpewo ikpem ziri ezi na okwu-ikpem; I nọduru n'oche-eze, buru onye-ikpe nēme ezi omume.

5I basiwo mba nile ọzọ nba, I mewo ka ndi nēmebi iwu la n'iyì, I hichapuwo aha-ha rue mb͕e nile ebighi-ebi.

6Ndi-iro agwusiwo, ha bu nkpọnkpọ ebe rue mb͕e ebighi-ebi; Ọzọ, obodo nile nke I ropuworo, Ncheta-ha, ọbuná nke obodo ahu, alawo n'yì.

7Ma Jehova nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi: O doziwo oche-eze-Ya ikpe ikpe.

8Ya onwe-ya gēkpe uwa dum madu bi ikpe n'ezi omume, Ọ gēkpe ndi nile di n'uwa ikpe n'izi-ezi.

9Jehova bu-kwa-ra onye anāzọpia ulo-elu, Bú ulo-elu nke diri mb͕e nile nke nkpà;

10Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi; N'ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova.

11Bùkuenu Jehova abù ọma, bú Onye bi na Zaion: Gosinu omume-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.

12N'ihi na Onye nājuta ọbara ndi eb͕uru eb͕u echetawo ha: O chezọghi iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala.

13Merem amara, Jehova; Hu nweda-n'alam nke sitere n'aka ndi nākpọm asì, Gi Onye nēbulim elu site n'ọnu-uzọ-ama ọnwu;

14Ka m'we kọ akukọ otuto-Gi nile: N'ọnu-uzọ-ama nile nke ada Zaion, Ka m'ṅuria ọṅu na nzọputa-Gi.

15Mba nile ọzọ emikpuwo n'olùlù ha mere: N'ub͕u nke ha zobere ka anānwude ukwu-ha.

16Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo: N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà.

16Higgaion. Selah

17Ndi nēmebi iwu gālaghachi n'ala mọ, Bú mba nile ndi nēchezo Chineke.

18N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka agēchezọ ob͕eye, Olile-anya nke ndi di ume-ala n'obi agaghi-ala n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi.

19Bilie, Jehova; ekwela ka madu di ike: Ka ekpe mba nile ikpe n'iru Gi.

20Jehova, doro ha ihe-egwu: Ka mba nile mara na nání madu ka ha bu.

20Selah