1Chineke nke ọ́bọ̀ nile, Jehova, Chineke nke ọ́bọ̀ nile, nwuputa ìhè.
2Bulie Onwe-gi, Onye-ikpe nke uwa: Nyeghachi ndi-npako nmeso-ha.
3Jehova, rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu, Rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu gāṅuri ọṅu-agha?
4Ha nēkwuwa okwu-ọnu, ha nēkwu oké okwu: Ndi nile nke nālu ajọ ihe nānya isi.
5Ndi-Gi ka ha nāzọpia, Jehova, Ọ bu kwa ihe-nketa-Gi ka ha nēweda n'ala.
6Ha nēb͕u nwanyi di-ya nwuru, na ọbìa, Ha nēb͕u kwa umu-nb͕ei n'ọchu.
7Ha we si, Ja agaghi-ahu, Chineke nke Jekob agaghi-amata kwa.
8Ghọtanu, unu ndi bu anu-ọhia n'etiti ndi Israel: Unu ndi-nzuzu kwa, òle mb͕e unu gēnwe uche?
9Onye nāku nti dika ihe-ọkukú, Ọ̀ gaghi-anu íhe? Ma-ọbu Onye nākpu anya, Ọ̀ gaghi-ahuwa uzọ?
10Onye nādọ mba nile aka na nti, Ọ̀ gaghi-aba nba, Bú Onye nēzí madu ihe-ọmuma?
11Jehova mara èchìchè madu, Na èchìchè ahu bu nání otù nku-ume.
12Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja, Onye I nēsi kwa n'iwu-Gi zí ihe;
13Ime ka ọ nọ jū pua n'ubọchi nile nke ihe ọjọ, Rue mb͕e agēgwuru onye nēmebi iwu olùlù.
14N'ihi na Jehova agaghi-ara ndi-Ya aka, Ọ gaghi-arapu kwa ihe-nketa-Ya.
15N'ihi na ikpé gālaghachikute ezi omume: Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gēso kwa ya.
16Ònye gēbilirim imegide ndi nēme ihe ọjọ? Ònye gēme onwe-ya ka o guzosierem ike imegide ndi nālu ajọ ihe?
17Ọ buru na Jehova abughi onye nēyerem aka, Ọ fọduru nwa mb͕e nkpuru-obim gēbiwori n'ebe inọ-dū.
18Ọ buru na asiwom, Ewezugawo ukwum n'ọnọdu-ya; Ebere-Gi nākwagidem, Jehova.
19Mb͕e ncheb͕um nāba uba n'imem, Nkasi-obi-Gi nile nāgugu nkpuru-obim.
20Àgējikọta Gi na oche-eze nke ihe-ila-n'iyì nile, Nke nēji ukpuru kpuzí nmeb͕u?
21Ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe imegide nkpuru-obi onye ezi omume, Ọ bu kwa ọbara nēmeghi ihe ọjọ ka ha nāma ikpe.
22Ma Jehova aburuworom ulo-elu; Chinekem bu kwa oké nkume nke ebe-nb͕abàm.
23O mewo kwa ka ajọ ihe-ha laghachikute ha, Ọ bu kwa ihe ọjọ ha ka Ọ gēji kpochapu ha; Jehova, bú Chineke-ayi, gēkpochapu ha.