1Bùkuenu Jehova abù ọhu: Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile.
2Bùkuenu Jehova abù, gọzienu aha-Ya; Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.
3Kọsanu akukọ ebube-Ya n'etiti mba nile, Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.
4N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku: Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu n'elu chi nile.
5N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu: Ma Jehova mere elu-igwe.
6Ebube na ima-nma di n'iru Ya: Ike na nma di n'ebe nsọ Ya.
7Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche, Nyenu Jehova nsọpuru na ike.
8Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya: Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bata n'ogige-Ya nile.
9Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ: Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile.
10Sinu n'etiti mba nile, Jehova bu eze: Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya: Ọ gēkpe ndi nile di iche iche ikpe n'izi-ezi.
11Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù; Ka oké osimiri bib͕o, ya na ùjú-ya;
12Ka ọhia ṅuria ọṅu-agha, ya na ihe nile nke di nime ya; Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù;
13N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo; N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe: Ọ gēji ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe, Ọ gēji kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Ya kpe ndi nile di iche iche ikpe.