ABÙ ỌMA 97:1-12 IGBOB1970 - Bible AI

1Jehova bu eze; ka uwa tegharia egwu ọṅù; Ka ala bara uba nke di oké osimiri buruburu ṅuria.

2Igwe-oji na oké ọchichiri di Ya buruburu: Ezi omume na ikpé ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Ya.

3Ọku nāga n'iru Ya, Nēsure kwa ndi-nkpab͕u-Ya buruburu.

4Àmùmà-Ya nile nyere elu-uwa dum madu bi ìhè: Uwa huru ya, o we gbue ya nb͕u.

5Ugwu nile b͕azepuru dika wax n'iru Jehova, N'iru Onye-nwe uwa nile.

6Elu-igwe gosiri ezi omume-Ya, Ndi nile di iche iche hu-kwa-ra ebube-Ya.

7Ka ihere me ndi nile ndi nēfè arusi apiri api òfùfè, Ndi nānya isi n'ihe-efu di iche iche: Kpọnu isi ala nya Ya, unu chi nile.

8Zaion nuru, we ṅuria, Umu-ndinyom Juda we tegharia egwu ọǹù; N'ihi ikpé-Gi nile, Jehova.

9N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye kachasi ihe nile elu n'elu uwa nile: Emewo ka I di elu nke-uku n'elu chi nile.

10Unu ndi nāhu Jehova n'anya, kpọnu ihe ọjọ asì: Ọ nēdebe nkpuru-obi ndi-ebere-Ya; Ọ nānaputa ha n'aka ndi nēmebi iwu.

11Aghaworo onye ezi omume ìhè dika nkpuru, Aghawo-kwa-ra ndi ziri ezi n'obi ọṅù.

12Ṅurianu na Jehova, unu ndi ezi omume; Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ.

>