ABÙ ỌMA 98:1-9 IGBOB1970 - Bible AI

1Abù Ọma. Bùkuenu Jehova abù ọhu; N'ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche; Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa.

2Jehova emewo ka amara nzọputa-Ya: N'anya mba nile ka O kpugheworo ezi omume-Ya.

3O chetawo ebere-Ya na ikwesi-ntukwasi-obi-Ya n'ebe ulo Israel di: Nsọtu nile nke uwa ahuwo nzọputa Chineke-ayi.

4Tikusienu Jehova nkpu ọṅù ike, uwa nile: Tiwanu nkpu, tienu nkpu ọṅù, bùanu abù ọma.

5Werenu ubọ-akwara bùkue Jehova abù ọma; Werenu ubọ-akwara na olu abù ọma.

6Chirinu opì na olu opì-ike Tisie nkpu ọṅù ike n'iru Eze, bù Jehova.

7Ka oké osimiri bib͕ọ, na ùjú-ya; Elu-uwa dum madu bi, na ndi bi nime ya;

8Ka osimiri nile kua aka-ha; Ka ugwu tie nkpu ọṅù n'otù;

9N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe: Ọ gēwere ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe, Ọ gēwere kwa izi-ezi kpe ndi nile di iche iche.