ABÙ NKE ABÙ 2:1-17 IGBOB1970 - Bible AI

1Mu onwem bu rose nke Sheron, Abum urodi nke ndagwurugwu.

2Dika urodi n'etiti ogwu, Otú a ka eyìm di n'etiti umu-ndinyom.

2

3Dika osisi apple n'etiti osisi oké ọhia, Otú a ka onye ihe-ya nātọm utọ di n'etiti umu-ndikom. Ǹdò-ya ka m'chọsiworo ike, m'we nọdu ala, Nkpuru-ya tọ-kwa-ra okpo-ọnum utọ.

4O mere ka m'bata n'ulo manya-vine, Ọkọlọtọ-ya n'elum bu kwa ihu-n'anya.

5Werenu mbadamba nkpuru-vine amiri ami b͕am ume, werenu nkpuru-osisi apple me ka arum di ike: N'ihi na onye nāria ọria ihu-n'anya ka m'bu.

6Aka-ekpe-ya di n'okpuru isim, Aka-nri-ya nāb͕akum.

6

7Unu umu-ndinyom Jerusalem, Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi, Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n'anya teta, ma ọli, Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.

7

8Ọ bu olu onye ihe-ya nātọm utọ! le kwa, ọ nābia, Nāmali elu n'elu ugwu nile, nāwuli elu n'elu ugwu ntà nile.

9Onye ihe-ya nātọm utọ yiri mb͕ada ma-ọbu nwa-ele: Le kwa, ọ nēguzo n'azu mb͕idi-ayi, Ọ nēsi na window nile lebata anya, Anya-ya nēsi n'oghere-inara-ifufe nwubata.

10Onye ihe-ya nātọm utọ zara, sim, Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.

11N'ihi na, le, mb͕e oyi agabigawo, Oké miri-ozuzo agawo, ọ lawo;

12Ahuwo okoko-ọhia anya n'ala; Mb͕e abù ọma nke umu-nnunu eruwo, Anuwo kwa olu nduru n'ala-ayi;

13Osisi fig achawo nkpuru fig-ya nāchaghi acha, Osisi vine nile nāb͕awa okoko, Ha esìpuwo ísì utọ ha. Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.

14Gi ndurum, nke di na nb͕awa nkume di elu, n'ebe-nzuzo nke ebe di nkputankpu, Me ka m'hu iru-gi, me ka m'nu olu-gi; N'ihi na olu-gi nātọ utọ, iru-gi ma-kwa-ra nma.

15Nwuderenu ayi nkita-ọhia nile, bú nkita-ọhia di ntà, ndi nēmebi ubi-vine nile; N'ihi na ubi-vine-ayi nāb͕awa okoko.

16Onye ihe-ya nātọm utọ bu nkem, mu onwem bu kwa nke ya: Bú onye ahu nke nāzù ìgwè aturu-ya n'etiti urodi.

17Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n'ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa, Chigharia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, me onwe-gi ka i yie mb͕ada ma-ọbu nwa-ele N'elu ugwu nile nke Beta.

cle>