ABÙ NKE ABÙ 3:1-11 IGBOB1970 - Bible AI

1N'elu ihe-ndinam n'abali ka m'chọrọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya: Achọrọm ya, ma achọtaghm ya.

2M'siri, Biko, ka m'bilie, jegharia n'obodo buruburu, N'amá nile na n'ebe nile sara mbara, Ka m'chọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya: Achọrọm ya, ma achọtaghm ya.

3Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum: M'we si ha, Ùnu ahuwo onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya?

4Ọ bu nání nwantī ka m'siri n'ebe ha nọ gabiga, Mb͕e m'chọtara onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya: Ejiderem ya, arakwaghm ya aka, Rue mb͕e m'mere ka ọ ba n'ulo nnem, Na n'ime-ulo nke nwayi turu imem.

4

5Unu umu-ndinyom Jerusalem, Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi, Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n'anya teta, ma-ọli, Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.

5

6Ọnye bu nka nke nēsi n'ọzara arigota dika ogidi di iche iche nke anwuru-ọku, Nke anēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bú myrrh na frankincense, Site n'ihe nile egwere egwe nke onye-ahia?

7Le, ọ bu ihe-ndina-ya, bú nke Solomon nwere; Ọgu ndi-dike atọ di ya buruburu, Site na ndi-dike nke Israel.

8Ha nile ji mma-agha, ha bu ndi emeworo ka ha muta ibu agha: Onye ọ bula, mma-agha-ya di n'úkwù-ya, N'ihi egwu n'abali.

9Eze, bú Solomon, emeworo onwe-ya otù palanquin Site n'osisi Lebanon.

10Ogidi-ya nile ka o jiri ọla-ọcha me, Ala-ya ka o jiri ọla-edo me, ebe-ọnọdu-ya ka o jiri ogho ododo me, Etiti-ya, eji ihu-n'anya me ka ọ buru pavement ọma, Site n'aka umu-ndinyom Jerusalem.

11Puanu, umu-ndinyom Zaion, lekwasi Solomon, bú eze, anya, Ka o kpuru okpu-eze nke nne-ya kpubeworo ya n'ubọchi ọlulu-nwunye-ya, Na n'ubọchi ọṅù nke obi-ya.

cle>