1Òle ebe onye ihe-ya nātọ gi utọ jeworo,Gi onye mara nma n'etiti ndinyom?Òle ebe onye ihe-ya nātọ gi utọ cheworo iru,Ka ayi we soro gi chọ ya?
2Onye ihe-ya nātọm utọ aridaruwo ubi-ya ab͕ara ogige, rue nkpuru nile nke uda,Izù ìgwè aturu-ya n'ubi-ya nile ab͕ara ogige, na ichikọta urodi.
3Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ, onye ihe-ya nātọm utọ bu kwa nkem:Bú onye ahu nke nāzù ìgwè aturu-ya n'etiti urodi.
3
4Onye mara nma ka i bu, eyìm, dika Tiaza,I mara nma nke-uku dika Jerusalem,I bu onye anātu ujọ dika usu-ndi-agha chi ọkọlọtọ.
5Wepu anya-gi abua n'irum,N'ihi na ha onwe-ha akpaliwom elu.Agiri-isi-gi di ka ìgwè ewu,Nke nēdina ala n'akuku ugwu Gilead.
6Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu,Nke siworo n'isa-aru rigota;Nke ha nile chi umu abua umu abua,Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n'etiti ha.
7Dika iberibe pomegranate ka akuku egedege-iru-gi buN'azu ákwà-nkpuchi-gi.
8Ọgu eze-nwanyi atọ di, ọgu ndinyom anọ, nke bu iko, di kwa,Na umu-ab͕ọghọ nādighi ọnu-ọgugu.
9Nání otù ka ọ bu, bú ndurum, onye nkem nke zuru okè;Nání otù nwa nne-ya muru ka ọ bu;Onye arọputara arọputa nke nwanyi muru ya nwere ka ọ bu.Umu-ndinyom huru ya, we si na ọ bu onye ihe nāgara nke-ọma;E, ọgu eze-nwanyi atọ ahu na ọgu ndinyom anọ ahu, bú iko, ha we to ya.
9
10Ònye bu nwanyi a nke nēlepu anya dika ututu,Nke mara nma dika ọnwa,Nēnwu ka anyanwu,Onye anātu ujo dika usu-ndi-agha chi ọkọlọtọ?
10
11Rue ubi walnut ab͕ara ogige ka m'ridara,Ilekwasi akwukwọ ndu nke ndagwurugwu anya,Ihu ma osisi vine amawo ifuru,Na ihu ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko.
12Mb͕e m'kāmaghi, nkpuru-obim doromN'etiti ub͕ọ-ala nke ndim amara aha-ya.
12
13Lata, lata, gi nwanyi Shulam;Lata, lata, ka ayi we lekwasi gi anya.Gini mere unu gēji lekwasi nwanyi Shulam anya,Dika ilekwasi otite-egwú nke Mahanaim?