ABÙ-ÁKWÁ 3:1-66 IGBOB1970 - Bible AI

1Mu onwem bu nwoke ahu nke huworo nweda-n'ala site na nkpa-n'aka nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.

2Mu ka O duworo me ka m'jegharia n'ọchichiri ghara inwe ìhè.

3N'ezie, mu ka Ọ nātughari aka-Ya megide ọtutu mb͕e ogologo ubọchi nile.

3

4O mewo ka anu-arum na akpukpọ-arum ka nká; Ọ b͕ajiwo ọkpukpum nile.

5O wuwo ńsí na ike-ọgwugwu dika ulo imegidem, were ya b͕am buruburu.

6N'ebe nile b͕ara ọchichiri ka O meworo ka m'biri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi.

6

7Ọ b͕achiwom ogige, m'we ghara ipu apu; O mewo ka ọla eji kem ab͕u di arọ́.

8Ọzọ, mb͕e m tikuru Chineke nkpu, O mechibido ekperem uzọ.

9O werewo nkume awara awa b͕achie uzọm nile, okporo-uzọm nile ka O meworo ka ha b͕agọ ab͕agọ.

9

10Bear nke nēche anwu ka Ọ burum, ma-ọbu ọdum nke nọ n'ebe-nzuzo di iche iche.

11Uzọm nile ka O wezugaworo, O we dọbisiem; O mewom ka m'tọb͕ọrọ n'efu.

12Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, O guzom dika ihe edotara ib͕a àkú.

12

13O mewo ka àkú nile nke àkpà-àkú-Ya ba n'akurum abua.

14Aghọworom ndim nile ihe-ọchi, na abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara ogologo ubọchi nile.

15O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m'ṅujue wormwood afọ.

15

16O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu.

17I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n'udo; echezọwom ọdi-nma.

18M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova.

18

19Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí.

20Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem.

21Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere.

21

22O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi.

23Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu.

24Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya.

24

25Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ.

26Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya.

27Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata.

27

28Ya nọdu náni ya iche, debe ọnu-ya du, n'ihi na Ọ tukwasiwo ya n'olu-ya.

29Ya tiye ọnu-ya n'ájá; ma eleghi anya ọ di olile-anya gādi.

30Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ.

30

31N'ihi na Onye-nwe-ayi agaghi-aju rue mb͕e ebighi-ebi.

32N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.

33N'ihi na Ọ dighi-esite n'obi-Ya weda umu madu n'ala, mekpa ha aru.

33

34Izọpia ndi-nkpọrọ nile nke uwa n'okpuru ukwu,

35Iwezuga ikpé ọ bula n'iru Onye kachasi ihe nile elu,

36Ime ka madu b͕agọ ab͕agọ n'okwu-ikpé-ya: Onye-nwe-ayi eleghi ihe ndia anya ọma.

36

37Ònye bu onye ahu nke kwuworo okwu, o we rè, mgbe onyenwe-ayi enyeghi iwu?

38Ọ̀ bughi n'ọnu Onye kachasi ihe nile ka ihe ọjọ na ezi ihe si aputa?

39Gini mere madu nke di ndu ji atamu ntamu, onye ọ bula, bayere ahuhu nmehie-ya nile?

39

40Ka ayi gwuputa ala uzọ nile ayi, nyochaputa ha, laghachikuru Jehova.

41Ka ayi weliere Chineke Nke bi n'elu-igwe obi-ayi n'ọbu-aka-ayi abua.

42Ayi onwe-ayi ejehiewo nupu kwa isi; Gi onwe-gi ab͕agharaghi.

42

43I werewo iwe kpuchie Onwe-gi, we chua ayi; I b͕uwo, I nweghi ọmiko.

44I werewo igwe-oji kpuchie Onwe-gi, ka ekpere-ayi we ghara igabiga.

45Ihe azachapuru azachapu na ihe ajuru aju ka I nēme ayi n'etiti ndi nile di iche iche.

45

46Ndi-iro-ayi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide ayi.

47Oké egwu na olùlù eruwo ayi aru, itọb͕ọ-n'efu na ntipia.

48Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim.

48

49Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi,

50Rue mb͕e Jehova gēsi n'elu-igwe lepu anya, hu.

51Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n'ihi umu-ndinyom nile nke obodom.

51

52Ndi bu ndi-irom n'efu achusiwo ntám ike dika nnunu.

53Ha ekpochapuwo ndum n'olùlù, we tuam nkume.

54Miri rubigaram n'isi; asirim, Ebipuwom.

54

55Esirim n'olùlù dichasi ala kpọkue aha-Gi, Jehova.

56Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n'iku-umem, na ntikum.

57I biaruru nso n'ubọchi m'kpọkuru Gi: I siri, Atula egwu.

57

58Onye-nwe-ayi, I kpezuwo ọnu nke nkpuru-obim; I b͕aputawo ndum.

59Jehova, I huwo nb͕agọm; Gi kpe ikpem.

60I huwo ibọ̀-ọ́bọ̀ nile ha na èchìchè nile ha n'arum.

60

61I nuwo ita-uta-ha, Jehova, na èchìchè nile ha megidem;

62Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi nēbili imegidem, na ntughari-obi-ha megidem ogologo ubọchi nile.

63Legide inọdu-ala-ha, na nbili-ọtọ-ha; mu onwem bu abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara.

63

64I gēnyeghachi ha nmeso-ha, Jehova, dika ọlu aka-ha si di.

65I gēnye ha ihe-nkpudo obi, bú ọb͕ub͕a-iyi I b͕ara ha.

66I gāchu ha n'iwe, kpochapu ha n'okpuru elu-igwe nke Jehova.

>