ABÙ-ÁKWÁ 5:1-22 IGBOB1970 - Bible AI

1Jehova, cheta ihe ruworo ayi aru: Legide anya, hu ita-uta-ayi.

2Ihe-nketa-ayi ab͕anwewo ihe ndi ala ọzọ, Ulo nile ab͕anwewo ihe ndi mba ọzọ.

3Umu-nb͕ei ka ayi ghọworo, bú ndi nēnweghi nna, Nne-ayi-hà di ka ndinyom di-ha nwuru.

4Miri-ayi ka ayi jiworo ego ṅua; Nkú-ayi nābiara ayi n'ọnu-ahia.

5Ọ bu inọkwasi n'olu-ayi ka achuworo ayi: Ayi adọb͕uwo onwe-ayi n'ọlu, ma ekweghi ka ayi zuru ike.

6Ijipt ka ayi kweyeworo ekweye, Ya na Asiria, ka nri we ju ayi afọ.

7Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu; Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.

8Ndi-orù achiwo ayi: Ọ dighi onye nānaputa ayi n'aka-ha.

9Ayi ji ndu-ayi n'aka weta nri-ayi N'ihi mma-agha nke ọzara.

10Akpukpọ-aru-ayi di ọku dika ite-ọku uku Site n'ifufe di ọku nke oké ugwu.

11Ndinyom nke di na Zaion ka ha wedara n'ala, Ha na umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke n'obodo nile nke Juda.

12Ekobere ndi-isi n'aka-ha: Asọpughi iru ndi-okenye.

13Umu-okorọbia buru nkume-igwe-nri, Umu-okoro su-kwa-ra ngọngọ n'okpuru nkú.

14Ndi-okenye akwusiwo inọ n'ọnu-uzọ-ama, Umu-okorọbia akwusiwo ikpọ ubọ-akwara-ha.

15Obi-utọ nke obi-ayi akwusiwo; Otite-egwú-ayi ab͕anwewo n'ib͕a-nkpe.

16Okpu-eze nke isi-ayi adawo n'ala: Ahuhu nādiri ayi nọ̄! n'ihi na ayi emehiewo.

17N'ihi nka ka aru nādighi obi-ayi nma; N'ihi ihe ndia ka anya-ayi b͕aworo ọchichiri.

18N'ihi ugwu Zaion, nke tọb͕ọrọ n'efu; Nkita-ọhia ejeghariwo na ya.

19Gi onwe-gi, Jehova, ọ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I nānọdu dika eze; Oche-eze-Gi nādiru ọb͕ọ nile.

20N'ìhi gini ka I nēchezọ ayi rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka I nārapu ayi rue ogologo ubọchi nile?

21Me ka ayi laghachikute Gi, Jehova, ayi gālata kwa; Me ka ubọchi nile ayi di ọhu dika na mb͕e ochie.

22Ma-ọbughi na I jusiwo ayi, Wesa ayi iwe nke-uku.

>