1Ha we bubata ib͕e Chineke, guzo ya n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: ha we weta nso àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Chineke.
2Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n'aha Jehova.
3Ọ we kesara madu ọ bula n'Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otù ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami.
4O we tiye ufọdu nime ndi Livai n'iru ib͕e Jehova, bú ndi nēje ozi, ọbuná ime ka echeta na ikele na ito Jehova, bú Chineke Israel:
5ha bu: Esaf, bú onye-isi, na Zekaraia, bú onye nke-abua ya, na Jeiel, na Shemiramot, na Jehiel, na Matitaia, na Elaiab, na Benaia, na Obede-edom, na Jeiel, chiri une na ubọ-akwara; Esaf nēwere kwa ájà me ka anu udà-ha;
6Benaia na Jehaziel, bú ndi-nchu-àjà, nāchiri kwa opì mb͕e nile, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke.
7Mb͕e ahu, n'ubọchi ahu, Devid buru uzọ nye iwu ikele Jehova, site n'aka Esaf na umu-nne-ya.
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37O we rapu n'ebe ahu, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, Esaf na umu-nne-ya, ije ozi n'iru ib͕e ahu mb͕e nile, dika ihe ubọchi n'ubọchi-ya si di:
38na Obed-edom na umu-nne-ha, ọgu ndikom atọ na asatọ; na Obed-edom nwa Jedutun, na Hosa, ibu ndi-ọnu-uzọ-ama:
39na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, n'iru ebe-obibi Jehova n'ebe di elu nke di na Gibeon,
40isurere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku mb͕e nile n'ututu na n'anyasi, ọbuná dika ihe nile si di nke edeworo n'iwu Jehova, nke O nyere Israel n'iwu;
41ha na Himan na Jedutun, na ndi fọduru nime ndi arọputara arọputa, ndi akpọrọ n'aha n'aha, ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di;
42ha na Himan na Jedutun, ndi chiri opì na ájà inye ndi nēme ka anu udà-ha, chiri kwa ihe abù Chineke: na umu Jedutun, inọ n'ọnu-uzọ-ama.
43Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n'ulo-ya: Devid we lata igọzi ulo-ya.