1Ilu di iche iche nke Solomon. Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria: Ma nwa di nzuzu bu iru-újú nne-ya.
2Àkù nke nmebi-iwu adighi-aba urù: Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu.
3Jehova agaghi-ekwe ka agu gub͕ue nkpuru-obi onye ezi omume: Ma ọchichọ nke ndi nēmebi iwu nāchọsi ike ka Ọ nākwapu.
4Ob͕eye ka onye ji ọbu-aka ume-ngwu alu ọlu gābu: Ma aka ndi di nkọ nēme ọgaranya.
5Onye nēkpokọta na mb͕e okpom-ọku bu nwa nēnwe uche: Ma onye nāraru ura n'owuwe-ihe-ubi bu nwa nēweta ihere.
6Ngọzi nile nādiri isi onye ezi omume: Ma ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.
7Ncheta anēcheta onye ezi omume bu ihe-ngọzi: Ma aha ndi nēmebi iwu gēre ure.
8Ndi obi-ha mara ihe gānata ihe enyere n'iwu: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.
9Onye nēje ije n'izu-okè nēje na ntukwasi-obi: Ma onye nēme ka uzọ-ya nile b͕agọ ab͕agọ, agāmara ya.
10Onye nēb͕u iku-anya nēnye ihe-nwuta: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.
11Isi-iyi nke ndu ka ọnu onye ezi omume bu: Ma ime-ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.
12Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche: Ma njehie nile ka ihu-n'anya nēkpuchi.
13N'eb͕ub͕ere-ọnu nke onye nāghọta ihe ka anāchọta amam-ihe: Ma nkpa-n'aka diri azu onye obi amam-ihe kọrọ.
14Ndi mara ihe nākpakọba ihe-ọmuma: Ma ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya bu nbibi di nso.
15Àkù nke ọgaranya bu obodo-ya siri ike: Nbibi nke ndi nēnweghi ike bu ob͕eye ha bu.
16Ọlu onye ezi omume nēdubà na ndu; Ihe-omume nke onye nēmebi iwu nēdubà na nmehie.
17Uzọ iru na ndu ka onye nēdebe idọ-aka-na-nti bu: Ma onye nārapu iba-nba nēme ka madu kpafue.
18Onye nēkpuchi ikpọ-asì nwere eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha; Ọzọ, onye nēme ka akukọ ọjọ puta, onye ahu bu onye-nzuzu.
19N'ọtutu okwu njehie adighi-akwusi: Ma onye nēb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye nwere uche.
20Ọla-ọcha arọputara arọputa ka ire onye ezi omume bu: Obi ndi nēmebi iwu di ka ihe ntà.
21Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume nāzù ọtutu madu: Ma ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha nānwu n'ihi na obi amam-ihe kọrọ ha.
22Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya, Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta.
23Ọ diri onye-nzuzu dika igwuri-egwú, bú ime ihe-nzube ọjọ: Otú a ka amam-ihe di-kwa-ra onye-nghọta.
24Ihe onye nēmebi iwu nātu ujọ ya, nke ahu gābiakute ya: Ma ihe ndi ezi omume nāchọsi ike ka agēnye ha.
25Mb͕e oké ifufe nēfebiga, onye nēmebi iwu anọghi kwa: Ma onye ezi omume bu ntọ-ala ebighi-ebi.
26Dika manya b͕ara uka si adi n'ebe ezé di, na dika anwuru-ọku si adi n'ebe anya di, Otú a ka onye-ume-ngwu nādi n'ebe ndi nēzì ya ozi nọ.
27Egwu Jehova nātukwasi ubọchi na ndu madu: Ma arọ nile nke ndi nēmebi iwu gādi nkpunkpu.
28Nchere ndi ezi omume gābu ọṅù: Ma olile-anya ndi nēmebi iwu gāla n'iyì.
29Ebe siri ike n'ebe onye zuru okè nọ ka uzọ Jehova bu; Ma ọ bu nbibi n'ebe ndi nālu ajọ ihe nọ.
30Agaghi-ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi: Ma ndi nēmebi iwu agaghi-ebi n'uwa.
31Ọnu onye ezi omume nāmi amam-ihe dika nkpuru: Ma ire nke nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, agēbipu ya.
32Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume mara ihe nātọ utọ: Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu.