ILU 12:1-28 IGBOB1970 - Bible AI

1Onye nāhu idọ-aka-na-nti n'anya nāhu ihe-ọmuma n'anya: Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia.

2Ezi madu gēnweputa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ: Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe.

3Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu: Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya.

4Nwanyi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya: Ma ọ di ka ire-ure n'ọkpukpu di-ya, bú nwayi nēweta ihere.

5Èchìchè nile nke ndi ezi omume bu ezi ikpé: Ma ndum-ọdu nile nke ndi nēmebi iwu bu aghughọ.

6Okwu nile nke ndi nēmebi iwu bu iche anwu ọbara: Ma ọnu ndi ziri ezi gānaputa ha.

7Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa: Ma ulo ndi ezi omume gēguzo.

8Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda.

9Ọ di nma, bú onye anēlelì, ma o nwere orù, Kari onye nāsọpuru onwe-ya, ma nri kọrọ ya.

10Onye ezi omume mara ndu anu-ulo-ya: Ma obi-ebere nile nke ndi nēmebi iwu bu enweghi-obi-ebere.

11Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri: Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, obi amam-ihe kọrọ ya.

12Onye nēmebi iwu achọsiwo ọnyà ndi ọjọ ike: Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume nāmi nkpuru.

13Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di: Ma onye ezi omume gēsi n'ahuhu puta.

14Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju onye ọ bula n'ezi ihe: Ọzọ, nmeso aka madu nke ọ nēmeso madu-ibe-ya, nke ahu ka agēnyeghachi ya.

15Uzọ nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ziri ezi n'anya ya onwe-ya: Ma onye nēge nti ndum-ọdu ka onye mara ihe bu.

16Onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya, n'otù ubọchi ahu ka anāmara iwe anākpasu ya: Ma onye nēkpuchi nlelì ka onye nwere ezi uche bu.

17Onye nēkupu ikwesi-ntukwasi-obi dika ume nēgosi ezi omume, Ma onye-àmà okwu-ugha nēgosi aghughọ.

18O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha: Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu.

19Eb͕ub͕ere-ọnu ezi-okwu gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi: Ma nání rue otù ntabi-anya ka ire okwu-ugha di.

20Aghughọ di n'obi ndi nēchèputa ihe ọjọ: Ma ndi nādu ọdu udo nwere ọṅù.

21Ọ dighi ajọ ihe ọ bula gādakwasi onye ezi omume: Ma ndi nēmebi iwu ejuputawo n'ihe ọjọ.

22Ihe-árú n'anya Jehova ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha bu: Ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe-ha nātọ Ya utọ.

23Madu nke nwere ezi uche nēkpuchi ihe-ọmuma: Ma obi ndi-nzuzu nākpọsa uche b͕agọrọ ab͕agọ.

24Aka ndi di nkọ gāchi achi: Ma onye-ume-ngwu gādi n'usu ndi nēfè òfùfè.

25Ncheb͕u n'obi madu nēme ka obi ruru ala; Ma okwu ọma nēme ka ọ ṅuria.

26Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ: Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue.

27Onye-ume-ngwu adighi-aru anu ọ chutara na ntá: Ma àkù madu nke di oké ọnu-ahia diri onye di nkọ.

28N'uzọ ezi omume ka ndu di; Ọzọ, n'uzọ nke okporo-uzọ-ya, ọ dighi ọnwu di ya.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>