ILU 15:1-33 IGBOB1970 - Bible AI

1Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu: Ma okwu nwuta nākpali iwe.

2Ire ndi mara ihe nēme ka ihe-ọmuma di nma: Ma ọnu ndi-nzuzu nēkwuwa okwu uche b͕agọrọ ab͕agọ.

3N'ebe nile ọ bula ka anya abua nke Jehova di, Nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche.

4Ire nke nāgwọ madu bu osisi nēnye ndu: Ma omume b͕agọrọ ab͕agọ nime ya bu ntipia nime mọ madu.

5Onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ nēlelì idọ-aka-na-nti nna-ya: Ma onye nāriba iba-nba ama gaghọ onye nwere ezi uche.

6N'ulo onye ezi omume ka ọtutu àkù di: Ma n'ihe-omume nke onye nēmebi iwu ka nmekpa-aru di.

7Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe nēfesa ihe-ọmuma: Ma obi ndi-nzuzu adighi-eme otú a.

8Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ.

9Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ onye nēmebi iwu bu: Ma onye nāb͕aso ezi omume ka Ọ nāhu n'anya.

10Idọ-aka-na-nti ọjọ diri onye nārapu uzọ: Onye nākpọ iba-nba asì gānwu.

11Ala-mọ na ebe-ila-n'iyì di n'iru Jehova? Òbi umu madu gēsi aṅa ghara idi n'iru Ya?

12Ọ dighi-atọ onye nākwa emò utọ ka abara ya nba: Ọ bughi onye mara ihe ka ọ gējekuru.

13Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka iru di nma: Ma eji ihe-nwuta nke obi tib͕ue mọ madu.

14Obi onye-nghọta nāchọ ihe-ọmuma: Ma ọnu ndi-nzuzu nāzù onwe-ya n'uche b͕agọrọ ab͕agọ dika anu-ulo.

15Ubọchi nile nke onye ewedara n'ala jọrọ njọ: Ma onye obi-ya di nma nēri oké oriri mb͕e nile.

16Ọ di nma inwe ihe ntà n'egwu Jehova, Kari inwe ọtutu àkù ma ọb͕ub͕a-aghara adi ya.

17Ọ di nma, bú òkè ihe-oriri nke bu nání akwukwọ nri, ma ihu-n'anya di n'ebe ahu, Kari ehi azùru azù ib͕u eb͕u, ma ikpọ-asì adi ya.

18Onye-ọnuma nākpali ise-okwu: Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū.

19Uzọ onye-ume-ngwu di ka ogige ogwu: Ma okporo-uzo ndi ziri ezi bu uzọ atuliri atuli.

20Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria: Ma madu nzuzu nēleda nne-ya anya.

21Uche b͕agọrọ ab͕agọ buru onye obi amam-ihe kọrọ ọṅù: Ma onye-nghọta nēme ka ije-ije-ya zie ezi.

22Nmebi èchìchè nile di mb͕e ìzù nzuzo nādigh: Ma n'ọtutu ndi nādu ọdu ka ha nēguzosi ike.

23Ọṅù diri onye ọ bula n'ọziza-okwu nke ọnu-ya: Ọzọ, okwu ekwuru na mb͕e-ya, le ka o si di nma nke-uku!

24Uzọ ndu nārigo elu n'ebe onye nwere uche nọ, Ka o we si n'ala-mọ di n'okpuru wezuga onwe-ya.

25Ulo ndi-npako ka Jehova gēropu: Ma Ọ gēme ka ókè-ala nwanyi di-ya nwuru guzosie ike.

26Ihe-árú n'anya Jehova ka èchìchè ọjọ nile bu: Ma okwu-ọnu utọ nile di ọcha.

27Onye nēmekpa èzí-na-ulo nke aka ya aru ka onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku bu: Ma onye nākpọ onyinye iri-ngo asì gādi ndu.

28Obi onye ezi omume nātughari uche n'iza okwu: Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwuwa ihe ọjọ di iche iche.

29Jehova di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ: Ma ekpere ndi ezi omume ka Ọ nānu.

30Ihe nke nēnye anya ìhè nēme ka obi ṅuria: Ezi ihe anuru anu nēme ka ọkpukpu nile ma abuba.

31Nti nke nānu iba-nba nke ndu, N'etiti ndi mara ihe ka ọ gānọ ọnọdu-abali.

32Onye nēzere idọ-aka-na-nti nāju nkpuru-obi nke aka ya: Ma onye nānu iba-nba nēnweta obi amam-ihe.

33Egwù Jehova bu idọ-aka-na-nti nke amam-ihe; Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>