ILU 16:1-33 IGBOB1970 - Bible AI

1Madu nwe ido obi n'usoro: Ma n'aka Jehova ka ọziza ire sitere.

2Uzọ nile nke onye ọ bula di ọcha n'anya-ya: Ma Onye nātùzi mọ nile nke madu ka Jehova bu.

3Turu ọlu-gi nile rue Jehova aru, Èchìchè-gi nile ewe guzosie ike.

4Ihe nile ka Jehova kpuru n'ihi Onwe-ya: E, ọbuná onye nēmebi iwu nāluru ubọchi ihe ọjọ ọlu.

5Ihe-árú n'anya Jehova ka onye ọ bula bu nke obi-ya di elu: Site n'aka rue aka, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

6Eji ebere na ezi-okwu ekpuchi ajọ omume: Ọ bu kwa egwu Jehova ka madu ji esi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.

7Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ, Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.

8Ọ di nma inwe ihe ntà n'ezi omume, Kari inwe ọtutu ihe-omume ma ikpé ziri ezi adighi ya.

9Obi madu nēchè uzọ-ya: Ma Jehova nēme ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.

10Ọjuju-ase di n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke eze: Mb͕e ọ nēkpe ikpe ọnu-ya adighi-emekpu emekpu.

11Ihe-ọtùtù na ihe-osìsì ziri ezi diri Jehova: Ọlu-Ya ka nkume-osìsì nile nke akpa bu.

12Ọ buru ndi-eze ihe-árú ime nmebi-iwu: N'ihi na ezi omume ka oche-eze ji eguzosi ike.

13Ihe nātọ ndi-eze utọ ka eb͕ub͕ere-ọnu ezi omume bu; Ọ bu kwa onye nēkwu ihe ziri ezi ka ha nāhu n'anya.

14Ọnuma eze bu ndi-ozi ọnwu: Ma onye mara ihe gēkpuchi ya.

15N'ìhè iru eze ka ndu di; Mb͕e ihe madu nātọ ya utọ, ọ di ka igwe-oji nke miri-ozuzo ikpe-azu.

16Inweta amam-ihe, le ka o si di nma nke-uku kari ọla-edo ọma! Inweta nghọta kwa, le ka o si buru ihe anārọputa nke-uku kari ọla-ọcha!

17Uzọ atuliri atuli nke ndi ziri ezi bu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha: Onye nēdebe nkpuru-obi-ya nēche uzọ-ya.

18N'iru ntipia ka npako nāga, Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.

19Ọ di nma inwe mọ di ala n'etiti ndi ewedara n'ala, Kari isoro ndi-npako kesa ihe akwatara n'agha.

20Onye nwere uche n'okwu Chineke gāchọta ezi ihe: Ọzọ, onye nātukwasi Jehova obi, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.

21Onye obi-ya mara ihe, agākpọ ya onye-nghọta: Ọzọ, utọ eb͕ub͕ere-ọnu nātukwasiri nmuta ihe.

22Isi-iyi nke ndu ka ezi uche bu n'ebe ndi-nwe-ya nọ: Ma idọ-aka-na-nti nke ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ bu uche b͕agọrọ ab͕agọ.

23Obi onye mara ihe nēme ka ọnu-ya nwe uche, Ọ nātukwasi-kwa-ra eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua nmuta.

24Ub͕ub͕ọ-manu-aṅu ka okwu-ọnu utọ nile bu, Nke nātọ nkpuru-obi utọ, buru kwa ihe nāgwọ ọkpukpu n'ọria.

25Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu, Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.

26Ọchichọ-nkpuru-obi nke onye nādọb͕u onwe-ya n'ọlu adọb͕uworo ya onwe-ya n'ọlu; N'ihi na ọnu-ya erugidewo ya.

27Onye jọb͕uru onwe-ya nēgwuputa ihe ọjọ: Ọ bu kwa n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka ihe dika ọku nāru aru di.

28Onye nāb͕akuta Chineke azu nēzisa ise-okwu: Ọzọ, onye nēkwu okwu-azu nēkewa ezi eyì.

29Onye nēme ihe-ike nārà madu-ibe-ya urà, Nēme kwa ka o je ije n'uzọ nādighi nma.

30Onye nātachi anya-ya abua ichè èchìchè ib͕akuta Chineke azu, Onye nātabi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, o mezuwo ihe ọjọ.

31Okpu-eze nke mara nma ka isi-awọ bu, N'uzọ ezi omume ka agāhu ya.

32Ọ di nma, bú onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, kari dike: Ọ di kwa nma, bú onye nāchi mọ-ya, kari onye nēwere obodo n'agha.

33Anēfe nzà, Ma n'aka Jehova ka ikpé-ya nile sitere.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>