1Ọ di nma iri iberibe achicha kpọrọ nku, ma inọ-n'udo adi ya, Kari ulo juputara n'àjà anēri nālu ọ̀gù.
2Orù nke nwere uche gāchi nwa madu nēweta ihere, Ọ bu kwa n'etiti umu-nne nwa ahu ka ọ gēkere ihe-nketa.
3Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo: Ma Onye nānwa obi bu Jehova.
4Onye nēme ihe ọjọ nātọ nti n'ala n'eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ajọ ihe; Onye-okwu-ugha nāṅa nti ire nēkwu ihe-ila-n'iyì.
5Onye nākwa ob͕eye emò atawo Onye meworo ya uta: Onye nāṅuri ọṅu bayere nhuju-anya ndi ọzọ, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
6Okpu-eze ndi-okenye ka umu umu bu; Ọzọ, ima-nma nke umu bu nna-ha.
7Ọ maghi nma n'ebe onye-nzuzu nọ, bú eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ihe makarisiri nma: Èb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu-ugha gēsi kwa aṅa ma nma n'ebe onye amara aha-ya nọ?
8Nkume amara ka iri-ngo bu n'anya ndi-nwe-ya: Ebe ọ bula ọ nēche iru ọ nāgara ya.
9Onye nēkpuchi njehie nāchọ ihu-n'anya: Ma onye nēkwu okwu mb͕e na mb͕e nēkewa ezi eyì.
10Ibasi-nba-ike nābàmi nime onye-nghọta Kari ka ọgu otiti ise gābà nime onye-nzuzu.
11Nání nnupu-isi ka onye ọjọ nāchọ; Ọ bu kwa onye-ozi nēnweghi obi-ebere ka agēziga megide ya.
12Ka nne-bear nke b͕ara aka umu-ya zute madu, Kari onye-nzuzu n'uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ.
13Onye nēnyeghachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Ihe ọjọ agaghi-apu n'ulo-ya.
14Dika mb͕e madu nērùpu miri, otú a ka isi-nmalite ise-okwu di: N'ihi ya tutu ilu-ọ̀gù esie ike rapu ya.
15Onye nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume, na onye nāma onye ezi omume ikpe, Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.
16N'ìhi gini kwa ka ego-ọzùzù-ahia di n'aka onye-nzuzu izuta amam-ihe, Mb͕e obi amam-ihe nādighi?
17Na mb͕e nile ka eyì nāhu n'anya, Anāmu kwa-nwa-nne bayere ahuhu.
18Madu nke obi amam-ihe kọrọ nānara madu n'aka ibu onye-mbe, Ọ nāghọ onye nọ na mbe n'iru madu-ibe-ya.
19Onye nāhu njehie n'anya nāhu ilu-ọ̀gù n'anya: Onye nēme ka ọnu-uzọ-ya di elu nāchọ ntipia.
20Onye obi-ya b͕agọrọ ab͕agọ adighi-achọta ezi ihe: Ọzọ, onye nāb͕anwe onwe-ya n'ire-ya gādabà n'ihe ọjọ.
21Onye nāmu onye-nzuzu ọ gāburu ya iru-újú: Nna onye-nzuzu adighi-aṅuri kwa ọṅu.
22Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka aru di nma: Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u nāmikọ ọkpukpu.
23Ihe-iri-ngo ka onye nēmebi iwu nēweputa n'uwe-obi-ya, Iwezuga uzọ nile nke ikpé.
24N'iru onye-nghọta ka amam-ihe di: Ma anya abua nke onye-nzuzu di na nsọtu uwa.
25Ihe nākpasu nna-ya iwe ka nwa nzuzu bu, Ọ bu-kwa-ra nwanyi muru ya ihe-ilu.
26Ọzọ, iri onye ezi omume nra adighi nma, Ọ dighi kwa nma itib͕u ndi amara aha-ha n'ihi izi-ezi-ha.
27Onye nēb͕ochi okwu-ọnu-ya mara ihe-ọmuma: Ọzọ, onye mọ-ya juru ajuru bu onye-nghọta.
28Ọbuná onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ, mb͕e ọ nāb͕a, anāgu ya n'onye mara ihe: Onye nēkpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye-nghọta.