1Ọchichọ nke ya onwe-ya nāchọsi ike ka onye nēkewapu onwe-ya nāchọ, Ọ bu ezi nzube-ihe nile ka ọ nālusosi ọ̀gù ike.
2Nghọta adighi-atọ onye-nzuzu utọ, Kama ọ bu nání ka obi-ya we kpughe onwe-ya.
3Mb͕e onye nēmebi iwu nābata, nleda-anya abatawo kwa, Ọ bu kwa nlelì ka ita-uta soro.
4Miri nke miri emi ka okwu nile nke ọnu madu bu; Iyi nērù erù ka isi-iyi amam-ihe bu.
5Ihu onye nēmebi iwu iru-ọma adighi nma, Iwezuga onye ezi omume n'ikpé. Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye-nzuzu nābà n'ilu-ọ̀gù,
6Ọnu-ya nākpọ kwa iti-ihe òkù.
7Ọnu onye-nzuzu buru ya nbibi, Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu kwa ọnyà nkpuru-obi-ya.
8Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri nātọ utọ nke-uku, Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.
9Ọzọ, onye di ume-ngwu n'ije-ozi-ya, Onye ahu bu nwa-nne nke onye-nwe nbibi.
10Ulo-elu di ike ka aha Jehova bu: Nime ya ka onye ezi omume nāb͕abà, o we nọ n'elu.
11Àkù ọgaranya bu obodo-ya siri ike, Ọ di kwa ka mb͕idi di elu nime ntughari-obi-ya nile.
12N'iru ntipia ka obi madu di elu, Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.
13Onye nāzaghachi okwu tutu ọ nu, Uche b͕agaọrọ ab͕agọ na ọnọdu-ihere ka ọ buru ya.
14Mọ madu gānagide ọria-ya; Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u, ònye gēburu ya?
15Obi onye-nghọta nēnweta ihe-ọmuma; Ọzọ, nti ndi mara ihe nāchọ ihe-ọmuma.
16Onyinye madu nākwara ya uzọ sara mbara, Ọ bu kwa n'iru ndi uku ka o nēdu ya je.
17Onye ezi omume n'anya ndi-ikpe ka onye ahu bu nke buru uzọ kpe ọnu-ya; Ma madu-ibe-ya abia gwuputa ala okwu-ya.
18Ife-nzà nēme ka ise-okwu kwusi, Ọ bu kwa ndi nwere ume ka ọ nēkewa.
19Nwa-nne ejehieworo megide di ike iwere kari obodo siri ike: Ise-okwu di kwa ka ihe-ntuchi nile nke-elu.
20Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju afọ onye ọ bula; N'ihe-omume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya ka afọ gēju ya.
21Ọnwu na ndu di ire n'aka; Ọzọ, ndi nāhu ya n'anya gēri nkpuru-ya.
22Onye chọtaworo nwunye achọtawo ezi ihe, Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.
23Okwu aririọ-amara di iche iche ka ob͕eye nēkwu: Ma ọgaranya nāza ike ike.
24Onye nēnwe ọtutu eyì nēnwe ha ibibi onwe-ya: Ma onye nāhu n'anya di nārapara n'aru kari nwa-nne.