1Nwam, ọ buru na i nara okwu-ọnum nile, Ọ buru kwa na i zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ;
2Itọrọ amam-ihe nti-gi n'ala, We wezuga obi-gi inwe nghọta;
3E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku, Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi;
4Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha, Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya:
5Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova, Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta.
6N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe; N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa:
7O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe, Ọ bu ọta ndi nēje ije n'izu-okè nwere;
8Iche okporo-uzọ nile nke ikpé, Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe.
9Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé, Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula.
10N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi, Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ;
11Ìzùzù ganēche gi nche, Nghọta gēchebe gi:
12Inaputa gi n'uzọ onye ọjọ, N'aka madu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu;
13Bú ndi nārapu okporo-uzọ nile nke izi-ezi, Ka ha we je ije n'uzọ nile nke ọchichiri;
14Ndi nāṅuri ime ihe ọjọ, Ha nēteghari egwú ọṅù n'ib͕akuta Chineke azu nke onye ọjọ;
15Ndi okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ab͕agọ, Ha nēsihie kwa n'uzọ nile ha:
16Inaputa gi n'aka nwayi nābughi nwunye-gi, N'aka nwayi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ;
17Nke nārapu di o nwere n'ab͕ọghọ, Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke-ya kwa, o chezọwo ya:
18N'ihi na uzọ iridaru ọnwu ka ulo-ya bu, Ọ bu kwa uzọ iridaru n'ebe ndi nādighi ndu nọ ka uzọ-ya nile bu.
19Ndi nile ndi nābakuru ya, ha adighi-alata, Ha adighi-eru kwa okporo-uzọ nile nke ndu:
20Ka i we je ije n'uzọ ndi di nma, Debe kwa okporo-uzọ nile nke ndi ezi omume.
21N'ihi na ndi ziri ezi gēbi n'uwa, Ndi zuru okè gāfọdu kwa nime ya.
22Ma ndi nēmebi iwu ka agēbipu n'uwa, Ọ bu kwa ndi nāghọ aghughọ ka agēropu na ya.