1Ekwosola ndi ọjọ ekworo, Achọsi-kwa-la ike inọ n'etiti ha:
2N'ihi na ipunara-madu-ihe ka obi-ha nātughari, Okwu nmeb͕u ka eb͕ub͕ere-ọnu-ha nēkwu.
3Amam-ihe ka eji ewu ulo; Ọ bu kwa nghọta ka eji eme ka o guzosie ike:
4Site kwa n'ihe-ọmuma ka ime-ulo-ya nile nējuputa N'àkù nile di oké ọnu-ahia di kwa utọ.
5Onye mara ihe di ike; E, onye nwere ihe-ọmuma nēme ka ike nwe ume.
6N'ihi na ezi ndum-ọdu ka i gēji eburu onwe-gi agha: Ọzọ, nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.
7Amam-ihe adikara onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ elu: Ọ dighi-asaghe ọnu-ya n'ọnu-uzọ-ama.
8Onye nēchè ime ihe ọjọ, Ya ka agākpọ onye-nwe nzube ọjọ nile.
9Nzube nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ bu nmehie: Ọzọ, ihe-árú n'anya madu ka onye nke nākwa emò bu.
10Ọ buru na i di ume-ngwu n'ubọchi ahuhu, Ike-gi pere npe.
11Naputa ndi anāchigara ọnwu, Ndi ahu kwa anēwezuga n'ọnọdu-ha nye n'ob͕ub͕u, gi lezie anya ka i b͕ochie ha.
12Mb͕e i si, Le, ayi amaghi ihe a: Onye nātùzi obi nile, Ònye ahu adighi-aghọta? Onye nēche kwa nkpuru-obi-gi nche, Ònye ahu adighi-ama? Ọ̀ gaghi-enyeghachi kwa madu dika ọlu-ya si di?
13Nwam, racha manu-aṅu, n'ihi na ọ di nma; Ya na manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi, nke nātọ okpo-ọnu-gi utọ:
14Mara na otù a ka amam-ihe diri nkpuru-obi-gi: Ọ buru na i chọtawo ya, ọdi-n'iru gādi kwa, Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.
15Gi onye nēmebi iwu, echela anwu imegide ebe-obibi onye ezi omume; Apunarala ya ebe-izu-ike-ya:
16N'ihi na ub͕ò asa ka onye ezi omume nāda, bili kwa ọzọ: Ma ndi nēmebi iwu nāsu ngọngọ n'ihe ọjọ.
17Aṅurila mb͕e onye-iro-gi nāda, Ka obi-gi ghara kwa iteghari egwú ọṅù mb͕e ọ nāsu ngọngọ:
18Ka Jehova we ghara ihu ya, o we jọ njọ n'anya-Ya, O we me ka iwe-Ya si n'aru ya laghachi.
19Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ; Ekwosola ndi nēmebi iwu ekworo.
20N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ; Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.
21Nwam, tua egwu Jehova na eze: Agwakọtala onwe-gi na ndi nēnwo enwo:
22N'ihi na ọ bu na mberede ka nhuju-anya-ha gēbili; Ọdida nke ha abua kwa, ònye mara ya?
23Imata iru madu n'ikpé adighi nma.
24Onye nāsi onye nēmebi iwu, Onye ezi omume ka i bu; Ndi nile di iche iche gākpọlu ya, mba nile gēwesa ya iwe:
25Ma ndi nābara ya nba ka ọ gādi utọ, Ọ bu kwa ndi ahu ka ezi ngọzi gābiakwasi.
26O ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua esutu ọnu, Bú onye nāza okwu ziri ezi.
27Dozie ije-ozi-gi n'èzí, Jikere-kwa-ra ya onwe-gi n'ọhia; Emesia wu kwa ulo-gi.
28Abula onye-àmà megide madu-ibe-gi n'efu; Ì gēji kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua rafu?
29Asila, Dika o siri mem, otú a ka m'gēme ya; M'gēnyeghachi onye ahu dika ọlu-ya si di.
30N'akuku ubi onye-ume-ngwu ka m'gabigara, Na n'akuku ubi-vine nke madu obi amam-ihe kọrọ;
31Ma, le, o púchiri n'ogwu, Akuba kpuchiri iru-ya, Akwada-kwa-ra mb͕idi nkume ya.
32Mu onwem we hu, m'we tukwasi obim na ya: Ahurum ya, we nata idọ-aka-na-nti.
33Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà, Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala:
34Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe; Ihe-ukọ-gi kwa, dika nwoke ji ọta.