ILU 28:1-28 IGBOB1970 - Bible AI

1Ndi nēmebi iwu ab͕alagawo mb͕e ọ dighi onye nāchu ha: Ma ndi ezi omume nwere ntukwasi-obi dika ọdum.

2N'ihi njehie nke ala ha di ọtutu, bú ndi-isi-ya: Ma site na madu nwere nghọta na ihe-ọmuma ka ọnọdu-ya gādigide ogologo mb͕e.

3Nwoke bu ob͕eye nke nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, Ọ di ka miri-ozuzo nke nāzachapu ihe, nri we ghara idi.

4Ndi nārapu iwu nēto onye nēmebi iwu, Ma ndi nēdebe iwu nāluso ha ọ̀gù.

5Ndi ọjọ adighi-aghọta ikpé: Ma ndi nāchọ Jehova nāghọta ihe nile.

6Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya, Kari onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ-ya abua, ọ bu ezie na onye ahu bu ọgaranya.

7Onye nēdebe iwu bu nwa nāghọta ihe: Ma onye bu eyì ndi nēribiga ihe ókè nētiye nna-ya n'onọdu-ihere.

8Onye nēme ka àkù-ya ba uba site n'inara uma na ọmuru-nwa, Ọ nēkpokọta ya nye onye nēmere ndi nēnweghi ike amara.

9Onye nēwezuga nti-ya n'inu iwu, Ọbuná ekpere-ya bu ihe-árú.

10Onye nēme ka ndi ziri ezi waghari n'uzọ ọjọ, N'olùlù nke aka ya ka ya onwe-ya gādabà: Ma ndi zuru okè gēketa ezi ihe.

11Onye mara ihe n'anya-ya ka ọgaranya bu; Ma onye nēnweghi ike nke nāghọta ihe nēgwuputa ala-ya.

12Mb͕e obi ndi ezi omume nātọ ha utọ, ọtutu ima-nma di: Ma mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, agāchọ madu achọ.

13Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya: Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.

14Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātu oké egwu mb͕e nile: Ma onye nēme ka obi-ya sie ike gādabà n'ihe ọjọ.

15Ọdum nke nāb͕o uja na anu-ọhia bear nke nāb͕aghari Ka onye nēmebi iwu nke nāchi ndi nēnweghi ike bu.

16Gi onye-ndú nke nghọta kọrọ, nke bu kwa onye-nmeb͕u uku, Onye nākpọ urù nēzighi ezi asì gēme ka ubọchi-ya nile di ogologo.

17Madu nke ọbara madu nānyib͕u, Rue olùlù ka ọ gāb͕alaga; ka onye ọ bula ghara ijide ya.

18Onye nēje ije n'izu-okè ka agāzọputa: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ abua gāda ngwa ngwa.

19Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri: Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, afọ gēju ya n'ibu-ob͕eye.

20Onye ọ bula nke kwesiri ntukwasi-obi gēnwe ọtutu ngọzi: Ma onye nānukpọ onwe-ya ibu ọgaranya, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

21Imata iru madu n'ikpé adighi nma: Ọ dighi kwa nma ka madu ji n'ihi iberibe nri nējehie.

22Onye nāb͕aso àkù ka onye nwere anya ọjọ bu, Ma ọ maghi na ihe-ukọ gābiakute ya.

23Onye nābara madu nba gēmesia huta amara Kari onye nēkwu ire-utọ.

24Onye nānapu nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe n'ike, si, Ọ dighi njehie ọ bu; Onye ejikọtaworo ya na onye-nbibi ka ọ bu.

25Onye nkpuru-obi-ya di nganga nākpali ise-okwu: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme, ya ka ọ ma abuba.

26Onye nātukwasi obi n'obi nke aka ya, onye ahu bu onye-nzuzu: Ma onye nēje ije n'amam-ihe, onye ahu ka agēme ka o wepuga onwe-ya.

27Onye nēnye ob͕eye ihe, ihe adighi-akọ ya: Ma onye nēzobe anya-ya abua, agābu ya ọtutu ọnu.

28Mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, madu ezobe onwe-ya: Ma mb͕e ha nāla n'iyì, ndi ezi omume aba uba.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>