ILU 6:1-35 IGBOB1970 - Bible AI

1Nwam, ọ buru na i nọworo madu-ibe-gi na mbe, Ọ buru na i narawo onye ala ọzọ n'aka ibu onye-mbe,

2Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi ma gi n'ọnyà, Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi nwude gi.

3Me nka ub͕u a, nwam, we naputa onwe-gi, N'ihi na i bàwo n'ọbu-aka nke madu-ibe-gi; Je, kwe ka azọtọ gi n'ukwu, riọchie madu-ibe-gi nti.

4Enyela anya-gi abua ura, Enye-kwa-la mbubere-anya-gi irù-ura.

5Naputa onwe-gi dika mb͕ada n'aka onye-ntá, Na dika nnunu n'aka osi-ọnyà.

6Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu; Le uzọ-ya nile, we mara ihe:

7Nke nēnweghi onye-isi, ma-ọbu onye nēle anya n'ọlu, ma-ọbu onye nāchi achi,

8Ma ọ nēdozi nri-ya na mb͕e okpom-ọku, Nēkpokọta kwa ihe-oriri-ya na mb͕e owuwe-ihe-ubi.

9Rùe ole mb͕e ka i ganēdina ala, gi onye-ume-ngwu? Òle mb͕e ka i gēsi n'ura-gi bilie?

10Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà, Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala;

11Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe, Ihe-ukọ-gi kwa dika nwoke ji ọta.

12Madu nke jọb͕uru onwe-ya, onye nēme ajọ ihe; O ji ọnu nke nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ ejeghari;

13O nēb͕u iku-anya-ya, o ji ukwu-ya abua ekwu okwu, O ji nkpisi-aka-ya nile nēzí ihe.

14Ib͕akuta Chineke azu di n'obi-ya, ọ nēchèputa ihe ọjọ na mb͕e nile: Ọ nēzisa ise-okwu.

15N'ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede; N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.

16Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì; E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya:

17Anya di elu, na ire okwu-ugha, Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;

18Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe, Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ;

19Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume, Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne.

19

20Nwam, chebe ihe nna-gi nyere n'iwu, Arapu-kwa-la iwu nne-gi:

21Hie ha n'obi-gi mb͕e nile, Ke ha n'olu-gi.

22Mb͕e i nējeghari, ọ ganēdu gi; Mb͕e i nēdina ala, ọ ganēche gi; Mb͕e i teta-kwa-ra, nke ahu gēso gi kparia uka.

23N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè; Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu:

24Idebe gi ka i pua n'aka nwayi ọjọ, N'aka ire-utọ nke ire nwayi nābughi nwunye-gi.

25Achọsila ima-nma-ya ike n'obi-gi; Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya.

26N'ihi na ọ bu n'ihi nwayi nākwa iko ka eji eme ka nwoke biarue nání otù ob͕e achicha: Nwunye nwoke ọzọ nāchu kwa ntá ndu di oké ọnu-ahia.

27Madu, ọ̀ gāguru ọku tiye n'uwe obi-ya, Ma uwe-ya agaghi-ere ọku?

28Ma-ọbu madu, ọ̀ gēje ije n'elu icheku-ọku, Ma ọku agaghi-aru ya n'ukwu-ya abua?

29Otú a ka onye nābakuru nwunye madu-ibe-ya di; Agaghi-agu onye ọ bula nke nēmetu nwayi ahu aka n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

30Madu adighi-eleda onye-ori anya, mb͕e o nēzu ori Imeju nkpuru-obi-ya mb͕e agu nāgu ya:

31Ma asi na achọta ya, ọ gākwughachi okpukpu asa; Àkù nile nke ulo-ya ka ọ gēnye.

32Onye nākwa nwayi iko, obi amam-ihe kọrọ ya: Onye nēmebi nkpuru-obi nke aka ya ka onye nēme ya bu.

33Ọnyá-ntiputa na nlelì ka ọ gāhu; Ita-uta-ya kwa, agaghi-ehichapu ya.

34N'ihi na ekworo bu ọnuma nke nwoke; Ọ gaghi-enwe ọmiko n'ubọchi ọ́bọ̀.

35Ọ gaghi-ahu ihe-ikpuchi-nmehie ọ bula iru ọma; Ọ gaghi-ekwe kwa, mb͕e i gēme ka ihe-iri-ngo ba uba.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
v>