ILU 8:1-36 IGBOB1970 - Bible AI

1Amam-ihe, ọ̀ dighi-akpọ òkù? Nghọta kwa, ọ̀ dighi-eme ka olu-ya da udà?

2N'elu ebe nile di elu n'akuku uzọ, N'ab͕ata uzọ nile, ka O guzoworo onwe-ya;

3N'akuku ọnu-uzọ-ama nile, n'ọnu amá obodo, Na nbata ọnu-uzọ nile, ka ọ nētisi nkpu ike, si,

4Ọ bu unu, madu, ka m'nākpọku; Olum nādaku kwa umu madu.

5Unu ndi nēnweghi uche, ghọtanu ezi uche; Unu ndi-nzuzu kwa, menu ka obi-unu ghọta ihe.

6Nurunu, n'ihi na isi ihe di iche iche ka m'nēkwu; Nsaghe eb͕ub͕ere-ọnum gābu kwa ihe di iche iche ziri ezi.

7N'ihi na ezi-okwu ka okpo-ọnum nēkwu dika onye nātughari uche; Ọzọ, ihe-árú nke eb͕ub͕ere-ọnum ka nmebi-iwu bu.

8N'ezi omume ka okwu nile nke ọnum di; Ọ dighi ihe nēzighi ezi ma-ọbu ihe b͕agọrọ ab͕agọ di nime ha.

9Ha nile putara ìhè n'ebe onye-nghọta nọ, Ha zi-kwa-ra ezi n'ebe ndi nāchọta ihe-ọmuma nọ.

10Nara idọ-aka-na-ntim, anara-kwa-la ọla-ọcha; Nara kwa ihe-ọmuma kari ọla-edo ọma arọputara arọputa.

11N'ihi na amam-ihe di nma kari ruby; Ihe nile kwa nke nātọ madu utọ, ha agaghi-ara ka ya.

12Mu onwem, bú amam-ihe, emewo ezi uche ebe-obibim, Ọ bu kwa ọmuma ihe-ìzùzù di iche iche ka m'nāchọputa.

13Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì: Npako, na nganga, na uzo ọjọ, Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì.

14Mu nwe ndum-ọdu na nzube-ihe: Mu onwem bu nghọta; mu nwe idi-ike.

15Mu ka ndi-eze ji abu eze, Ọ bu kwa mu ka ndi nāchi achi ji enye ukpuru, bú ezi omume.

16Mu ka ndi-isi ji abu ndi-isi, Ha na ndi amara aha-ha, bú ndi-ikpe nile nke uwa.

17Mu onwem nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhum n'anya; Ọ bu kwa ndi nāchọsim ike gāchọtam.

18Àkù na nsọpuru di n'akam; E, àkù nke nādigide na ezi omume.

19Nkpurum di nma kari ọla-edo ọma, e, kari ọla-edo anuchara anucha; Ihe-omumem di kwa nma kari ọla-ọcha arọputara arọputa.

20N'uzọ ezi omume ka m'nēje ije, N'etiti okporo-uzọ nile nke ikpé:

21Ime ka ndi nāhum n'anya keta ihe di adi, Ka m'we meju kwa ulo-àkù nile ha.

22Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya, Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu.

23Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m'guzosie ike, site n'isi-mbu, Tutu uwa adi.

24Mb͕e ọ dighi ob͕u-miri ọ bula di, amuputaram; Mb͕e ọ dighi isi-iyi ọ bula di nke juputara na miri.

25Tutu eme ka ntọ-ala ugwu nile bamie n'ala, Tutu ugwu ntà nile adi ka amuputaram:

26Mb͕e Ọ kēmeghi uwa, ma-ọbu azu obodo, Ma-ọbu nmalite ájá nke elu-uwa dum madu bi.

27Mb͕e O doziri elu-igwe, n'ebe ahu ka m'nọ: Mb͕e O nyere ukpuru, si, Ka ihe b͕ara buruburu dikwasi n'iru ob͕u-miri:

28Mb͕e Ọ mere ka mbara-ígwé sie ike n'elu: Mb͕e emere ka isi-iyi nile nke ob͕u-miri di ike:

29Mb͕e O ji kpara oké osimiri ókè-ya, Ka miri we ghara igabiga okwu-ọnu-Ya: Mb͕e O ji turu ntọ-ala uwa ukpuru:

30Anọkwam n'akuku Ya, dika onye-ọ̀kà: M'we buru ihe nātọ Ya utọ kwa-ubọchi, Nēgwuri egwú n'iru Ya mb͕e nile;

31Nēgwuri egwú n'elu-uwa dum madu bi n'uwa-Ya; Ihe nātọm utọ di kwa n'ebe umu madu nọ.

32Ma ub͕u a, umum, genum nti: N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu.

33Nurunu idọ-aka-na-nti, we mara ihe, Unu eze-kwa-la ya ndu.

34Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke nēgem nti bu, N'imu anya n'akuku ibo-ọnu-uzọm nile kwa-ubọchi, Niche nche n'akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọm nile.

35N'ihi na onye nāchọtam achọtawo ndu, Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.

36Ma onye nēmehie megidem nēme nkpuru-obi-ya ihe-ike: Ndi nile nke nākpọm asì nāhu ọnwu n'anya.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
v>