JOB 10:1-22 IGBOB1970 - Bible AI

1Ike ndum agwuwo nkpuru-obim; Ka m'rapuru onwem ntamum; Ka m'kwue okwu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.

2M'gāsi Chineke, Amalam ikpe; Me ka m'mara ihe kpatara I ji som se okwu.

3Ọ̀ di Gi nma ka I meb͕ue nmeb͕u, Ka I ju ndọb͕u-n'ọlu nke ọbu-aka-Gi abua, We mukwasi ìhè na ndum-ọdu ndi nēmebi iwu?

4Ọ̀ bu anya anu-aru ka I nwere, Ma-ọbu na I nāhu dika madu si ahu?

5Ọ̀ bu dika ubọchi madu si di ka ubọchi-Gi di? Ma-ọbu arọ-Gi, hà di ka ubọchi madu,

6Na I nāchọ ajọ omumem, Nāju kwa ase nmehiem?

7Ọ bu ezie na I mara na adighm-emebi iwu; Ọ dighi kwa onye ọ bula nānaputa n'aka-Gi.

8Aka-Gi dozirim, we kpuam Ka m'buru otù buruburu; ma I nēlodam.

9Biko, cheta na dika urọ ka I kpuworom; Ì gēme kwa ka m'laghachi n'ájá?

10Ọ̀ bughi dika miri-ara ka I nāwusim, Me ka m'raru araru dika cheese?

11Akpukpọ-aru na anu-aru ka I yikwasirim, Were kwa ọkpukpu na akwara kpam dika ákwà.

12Ndu na ebere ka I meworo ka m'nwe, Nlekọta-gi edebewo kwa mọm.

13Ma I zoro ihe ndia n'obi-Gi; Amawom na nka di n'aka-Gi:

14Ọ buru na emehiewom, I nēlezikwam anya, I gaghi-agupukwam n'ajọ omumem.

15Ọ buru na emebiwom iwu, ahuhu dirim; Ọ buru kwa na abum onye ezi omume, m'gaghi-eweli isim elu; Ebe nlelìm juworom afọ, Ya na ilekwasi nwedam anya.

16Ọ buru kwa na isim ewelie onwe-ya n'elu, dika ọdum nke nāb͕ọ uja ka I nāchu ntám: I we laghachi gosi Onwe-gi onye di ebube megidem.

17I nēme ka ndi-àmà-Gi di ọhu n'irum, Nēme kwa ka nkpasu-iwe-Gi ba uba n'ebe m'nọ; Nb͕anwe na usu-ndi-agha di n'ebe m'nọ.

18N'ìhi gini kwa ka I ji me ka m'si n'àkpà-nwa puta? M'gēkubìwori ume, ọ dighi kwa anya gāhum.

19Dika agāsi na ọ dighi mb͕e m'nọ, otú a ka m'gādi; Site n'afọ nnem rue ílì ka agēbum.

20Ùbọchim adighi ole-na-ole? rapu kwa, Dopu Onwe-gi n'ebe m'nọ, ka m'we b͕asa irum nwantī,

21Tutu alam, ghara kwa ilaghachi, Rue ala ọchichiri, na onyinyo ọnwu;

22Ala oké ọchichiri, dika oké ọchichiri onwe-ya; Ala onyinyo ọnwu, nke usoro nādighi ya, Ebe ọmumu-ìhè di kwa ka oké ọchichiri.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>