2Àgaghi-aza ọtutu okwu? Àgāgu kwa onye eb͕ub͕ere-ọnu n'onye ezi omume?
3Ekwukwu-Gi nile nēme ka madu b͕a nkiti; I we chìa ọchì, ma ọ dighi onye nēme ka ihere me gi.
4I we si, Nmutam di ọcha, M'di kwa ọcha n'anya-Gi.
5Ma otú ọ di, ọ gādim nọ̄ nma ma asi na Chineke ekwue okwu, Saghe eb͕ub͕ere-ọnu-Ya megide gi;
6Gosi gi ihe-nzuzo nile nke amam-ihe, Na ọ di okpukpu n'izube ihe. Gi mara kwa na Chineke nēme ka echezọrọ gi ufọdu nime ajọ omume-gi.
7Ì gēsi n'ogwugwu chọputa Chineke? Ì gāchọputa Onye Nke puru ime ihe nile rue ebe Ọ sọturu?
8Ọ ra ka ebe di elu nile nke elu-igwe; gini ka i gēme? Ọ di omimi kari ala-mọ; gini ka i gāmara?
9Ọtùtù-ya di ogologo kari uwa, Di kwa obosara kari oké osimiri.
10Ọ buru na Ọ ga n'iru, mechibido madu uzọ, Kpọkọta nkpọkọta, ònye gēme kwa ka Ọ laghachi?
11N'ihi na Ya onwe-ya mara madu efu: Ọ nāhu kwa ajọ ihe, mb͕e Ọ nādighi-elegide ya anya.
12Ma nkpọkọrọ madu gēnwe obi, Mb͕e amuru nwa-inyinya-ibu-ọhia ka ọ buru madu.
13Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi, We b͕asa ọbu-aka-gi abua n'ebe Ọ nọ;
14Ọ buru na ajọ ihe adi n'aka-gi, me ka ọ di n'ebe di anya, Ekwe-kwa-la ka ajọ omume biri nulo-ikwū-gi nile;
15N'ihi na mb͕e ahu i gēweli iru-gi nēnweghi ọlu n'aru-gi; I gābu kwa ihe siri ike dika ọla awuru awu, i gaghi-atu kwa egwu:
16N'ihi na gi onwe-gi gēchezọ ọnọdu ọjọ gi, Dika miri nke gabigara agabiga ka i gēcheta ya:
17Kari etiti-ehihie ka ubọchi ndu-gi gēbili kwa; Ọ buru na oké ọchichiri adi, ọ gādi ka ututu.
18I gātukwasi kwa obi, n'ihi na olile-anya di; I gēnyocha kwa, were ntukwasi-obi dina.
19Ọzọ kwa, i gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka i ma jijiji; Ọtutu madu gēme kwa ka iru-gi dajua.
20Ma anya ndi nēmebi iwu gādala n'isi, Ebe-nb͕alaga alanariowo kwa ha n'iyì, Nkubì-ume bu kwa olile-anya-ha.