2N'ezie unu onwe-unu bu ndi bu ihe, Unu na amam-ihe gānwukọ n'otù.
3Enwe-kwa-ram obi dika unu; Mu onwem abughi onye dara ada kari unu: Ma ònye ka ọ bu nke ihe dika ndia nādighi n'aka?
4Onye bu ihe-ọchì nke madu-ibe-ya ka m'bu, Bú onye nākpọku Chineke, O we za ya: Ihe-ọchì ka onye ezi omume nke zuru okè bu.
5Nleda diri ọdida n'èchìchè onye nọ jū; Edoziwo ya nye ndi ukwu-ha nāb͕uchapu ab͕uchapu.
6Ulo-ikwū nile nke ndi nāpunara madu ihe di n'udo, Ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi nākpasu Chineke iwe; Bú onye ọ bula nke wetaworo chi-ya n'aka-ya.
7Ma otú ọ di, biko, jua anumanu, ha gēzí kwa gi ihe, Na anu-ufe nke elu-igwe, ha gēgosi kwa gi:
8Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe; Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi.
9Ọ̀ bu onye nāmaghi n'ihe ndia nile, Na aka Jehova emewo nka?
10Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya, Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.
11Nti, ọ̀ dighi-anwa okwu? Okpo-ọnu kwa, ọ̀ dighi-edeturu onwe-ya ihe-oriri-ya?
12Nime ndi kara nká ka amam-ihe di, N'ubọchi ndu di ogologo ka nghọta di kwa.
13N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di; Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.
14Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ; Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.
15Le, Ọ nēb͕ochi miri, ha takọrọ; Ọzọ, ọ nēzipu ha, ha we kpùe uwa iru.
16N'aka-Ya ka ike na nzube-ihe di; O nwere onye nēmehie n'amaghi-ama na onye nēme ka madu mehie n'amaghi-ama.
17Ọ nēme ka ndi nādu ọdu la dika onye akwatara ihe-ya n'agha, Ọ nēme kwa ndi-ikpe ka ha ghọ ndi-nzuzu.
18Ab͕u ndi-eze kere ka Ọ tọpuworo, We ke ihe-ọkiké n'úkwù-ha.
19Ọ nēme ka ndi-nchu-àjà la dika onye akwatara ihe-ya nagha, Ndi nādigide ka Ọ nēme kwa ka ha kpùe iru.
20Ọ nēwezuga okwu eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, Ezi uche nke ndi-okenye ka Ọ nēwepu kwa.
21Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha, Akpukpọ-úkwù nke ndi di ike ka Ọ kpọpu-kwa-ra.
22Ọ nēsi n'ọchichiri kpughepu ihe di omimi, We me ka onyinyo ọnwu puta ìhè.
23Ọ nēme ka mba di uku, Ọ nēme kwa ka ha la n'iyì: Ọ nāb͕asa mba, nēdu kwa ha.
24Ọ nēwezuga obi ndi-isi nke ndi uwa, We me ka ha waghari n'ebe tọb͕ọrọ n'efu ebe uzọ nādighi.
25Ha nāsọghari ìsì n'ọchichiri nēnweghi ìhè, O we me ka ha kpafue dika onye ṅubigaworo manya ókè.