1Le, ihe a nile ka anyam huworo, Ntim anuwo, ghọta kwa ya.
2Dika ọmuma-ihe-unu si di, otú a ka m'maworo, ọbuná mu onwem: Mu onwem abughi onye dara ada kari unu.
3Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m'gāgwa okwu, Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka.
4Ma otú ọ di, unu onwe-unu bu ndi nētekpu madu okwu-ugha dika ihe-ntekpu, Ndi-dibia efu ka unu nile bu.
5Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti! Ọ we ghọro unu amam-ihe.
6Biko, nurunu iru-ukam, Ṅa-kwa-nu nti n'ikpe-ọnu nile nke eb͕ub͕ere-ọnum.
7Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume? Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ?
8Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma? Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù?
9Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu? Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò?
10Ọ ghaghi ibara unu nba, Ọ buru na unu ahu madu iru-ọma na nzuzo.
11Nbùli-elu-Ya adighi-eme ka unu tua egwu nke-uku? Oké egwu-Ya adighi-adakwasi kwa unu?
12Okwu-ncheta nile unu bu ilu nke ntu, Ihe-nb͕ochi urọ ka ihe-nb͕ochi nile unu bu.
13B͕anu nkiti, pua n'ebe m'nọ, ka m'kwu kwa, mu onwem, Gini gāgabiga kwa n'arum?
14N'ìhi gini ka m'gēburu anu-arum n'ezém, Tiye kwa ndum n'ọbu-akam?
15Le, Ọ gēb͕um; m'gaghi-echere: Otú ọ di, uzọm nile ka m'gāru uka n'iru Ya.
16Ọzọ, Ya onwe-ya gāburum nzọputa; N'ihi na onye emeruru emeru agaghi-abia n'iru Ya.
17Nurunu okwum nile nke-ọma, Ka nkwuputam di kwa na nti-unu.
18Biko, le, edowom ikpém n'usoro; Amawom na mu onwem bu onye ezi omume.
19Ònye bu onye ahu nke mu na ya gēkpe ikpe? N'ihi na ub͕u a ka m'gāb͕a nkiti, kubìe ume.
20Nání emelam ihe abua, Mb͕e ahu m'gaghi-ezopu onwem n'iru Gi:
21Me ka ọbu-aka-Gi dipu n'arum n'ebe di anya; Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m'tua egwu nke-uku.
22Gi kpọ kwa òkù, mu onwem gāza kwa; Ma-ọbu ka m'kwue, I we zam.
23Àjọ omume na nmehie m'nwere di ole? Me ka m'mara njehiem na nmehiem.
24N'ìhi gini ka I nēzo iru-Gi, Nēchè kwa na mu bu onye-iro n'ebe I nọ?
25Ì gēme ka akwukwọ osisi nke ifufe nēfepu ma jijiji? Ma-ọbu Ì gāchu ahihia ọ̄ka kpọrọ akpọ?
26N'ihi na I nēde ihe di ilu n'akwukwọ megidem, I nēme kwa ka m'nweta ajọ omume nile m'mere n'okorọbiam:
27I nētiye kwa ukwum abua n'ọtọsi, nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya; I nākpa Onwe-gi ókè buruburu ọbu-ukwum:
28Bú madu nke di ka ihe rere ure nke nāka nká, Dika uwe nke nla riworo.