JOB 15:1-35 IGBOB1970 - Bible AI

1Elifaz, bú onye Timan, we za, si,

2Onye mara ihe, ọ̀ gēwere ọmuma-ihe nke bu nání ifufe za? Ọ̀ gēmeju kwa afọ-ya n'ifufe Iru-anyanwu?

3Ọ̀ gēwere okwu nābaghi n'ihe ru uka, Ma-ọbu okwu nke ọ nējighi ha bara madu urù?

4E, gi onwe-gi nēmebi egwu, Nēbilata kwa ntughari-uche n'iru Chineke.

5N'ihi na ajọ omume-gi nēzi ọnu-gi ihe, I nārọputa kwa ire ndi-aghughọ.

6Ọnu-gi nāma gi ikpe, ọ bughi mu onwem; Eb͕ub͕ere-ọnu-gi nāza kwa imegide gi.

7Ì bu madu mbu amuru? Ma-ọbu àmuputara gi tutu ugwu adi?

8Ọ̀ bu ìzù nzuzo Chineke ka i nēge nti? Ì nēbilata-kwa-ra onwe-gi amam-ihe?

9Gini ka i mara nke ayi nāmaghi? Ì nāghọta ihe nke nādighi nime ayi?

10Ma onye-isi-awọ ma onye kara nká nọ n'etiti ayi, Ndi ubọchi ndu-ha ka nke nna-gi nke-uku.

11Ǹkasi-obi Chineke adikara gi ntà, Ha na okwu nke nēmeso gi nwayọ?

12Gini mere obi-gi ji ebupu gi? Gini me-kwa-ra anya-gi abua ji atabi?

13Na i nēchighari mọ-gi imegide Chineke, We me ka okwu nile di otú a si n'ọnu-gi puta.

14Gini ka madu bu, na ọ gādi ọcha n'obi, Na ọ gābu kwa onye ezi omume, bú onye nwayi muru?

15Le, ọbuná ndi nsọ Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi; Ọzọ, elu-igwe adighi ọcha n'anya-Ya.

16Ònye-árú nke b͕aruru ab͕aru dika miri gēsi kwa aṅa di ọcha n'anya-Ya, Bú madu nke nāṅu ajọ omume dika miri?

17M'gēkwuputara gi, gem nti; Ma nka ka m'huworo, m'gākọ kwa ya:

18(Nke ndi mara ihe nēgosi Site na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya;

19Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala, Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n'etiti ha:)

20Ubọchi nile nke onye nēmebi iwu ka onye ahu nāb͕ali, Bú ọnu-ọgugu arọ nke ezobeworo nye onye nēme ka madu ma jijiji.

21Olu oké egwu di na nti-ya abua; Mb͕e ọ nọ n'udo ka onye nāpunara madu ihe gābiakute ya:

22Ọ dighi-ekwe na ọ gēsi n'ochichiri lata, Onye anēche nche inye mma-agha ka ọ bu:

23Onye nāwaghari ichọ nri ka ọ bu, ọ nāsi, Òle ebe ọ di? Ọ mawo na edoziwo ubochi ọchichiri n'aka-ya:

24Ahuhu na nkpà nēme ka ọ tua egwu nke-uku; Ha nwere ike n'aru ya, dika eze nke nọ na njikere ibu agha:

25N'ihi na o setipuwo aka-ya imegide Chineke, Ọ bu kwa imegide Onye Nke puru ime ihe nile ka ọ nēme onwe-ya onye di ike;

26Ọ nēwere olu kwesiri ike b͕akwasi Ya, Were kwa ihe-nb͕ochi di ib͕idi nke ọta-ya:

27Nihi na o werewo abuba-ya kpuchie iru-ya, Me ka abuba nke di arọ́ di n'úkwù-ya;

28O we biri n'obodo ezopuru n'uwa, Nime ulo nke madu nādighi-ebi nime ha, Nke ejikereworo ighọ obo-ihe.

29Ọ gāghi-abu ọgaranya, àkù-ya adighi-eguzosi kwa ike, Ọ dighi-eseti kwa ihe ha nwere n'uwa.

30Ọ gaghi-esi n'ọchichiri wezuga onwe-ya; Ire-ọku gēme ka ome-ya kpọ nku, Ọ gēwezuga kwa onwe-ya site n'iku-ume nke ọnu-Ya.

31Ka ọ ghara ikwere n'ihe-efu, eduhiewo ya: N'ihi na ihe-efu gābu ihe-nb͕anwe-ya.

32Tutu ubọchi-ya erue ka agēmezu ya, Alaka-ya agaghi-adi ka ahihia ndu.

33Ọ gēnwosisi nkpuru-vine-ya nke nāchaghi acha, dika osisi vine, Ọ gātuda kwa okoko-osisi-ya, dika osisi olive.

34N'ihi na nzukọ nke onye emeruru emeru gābu ndi nāpughi imu nwa, Ọku gēripia ulo-ikwū nile nke ndi-ngo.

35Ha nāturu ime ọnọdu ọjọ, mua ajọ ihe, Afọ-ha nēdozi kwa aghughọ.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>