JOB 16:1-22 IGBOB1970 - Bible AI

1Job we za, si,

2Anuwom ọtutu ihe dika ihe ndia: Ndi-nkasi-obi nēweta ọnọdu ọjọ ka unu nile bu.

3Òkwu nke bu nání ifufe gēnwe ọgwugwu? Ma-ọbu gini nēme gi ka i di irè, na i nāza okwu?

4Ka mu onwem kwu kwa okwu dika unu; Ọ buru na nkpuru-obi-unu adi n'ọnọdu nkpuru-obim, M'gēnwe ike ijikọta okwu imegide unu, Na ifufe isim imegide unu.

5M'gēwere ọnum b͕a unu ume, Nmeghari eb͕ub͕ere-ọnum gēb͕ochi kwa ihe-nb͕u-unu.

6Ọ buru na ekwuem, adighi-eb͕ochi ihe-nb͕um: Ma ọ buru na arapum, gini gēsi n'arum la?

7Otú ọ di, ub͕u a O mewo ka ike gwum: I mewo ka nzukọm nile ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.

8I we jisiem ike, ọ ghọwo ihe-àmà megidem: Ọtita-arum we nēbili imegidem, Ọ nāzam n'iru.

9Iwe-ya adọkawom O we kpọm asì; Ọ takwasiwom ikekere ezé-Ya: Onye-nkpab͕um nāchichapu anya-Ya n'arum.

10Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum, Were ita-uta tiem aka na ǹtì: Ha nāchikọzu onwe-ha n'otù imegidem.

11Chineke nēmechibidom uzọ nye ndi ajọ omume, N'aka ndi nēmebi iwu ka Ọ nātubàkwam.

12Anọm n'udo, O we mebiem; Ọzọ, O jidewo olum, piajisiam, Me ka m'biliere Onwe-ya ibu ihe O dotara ib͕a àkú.

13Àkú-Ya nile dim buruburu, Ọ nāb͕awa akurum, Ọ dighi-enwe kwa ọmiko n'arum; Ọ nāwusi òlùlùm n'ala.

14O nētipúm ntipú n'elu ntipú-ibe-ya; Ọ nāb͕akwasim dika dike.

15Ákwà-nkpe ka m'dukọtaworo n'elu akpukpọ-arum, Turughari mpim n'ájá.

16Irum nācha ọbara-ọbara site n'ikwa-ákwá, Na mbubere-anyam ka onyinyo ọnwu di kwa;

17Ọ bughi n'ihi na ihe-ike di n'ọbu-akam, Ekperem di kwa ọcha.

18Ala, ekpuchila ọbaram, Ka ọnọdu ghara idiri iti-nkpum.

19Ọbuná ub͕u a, le, n'elu-igwe ka Onye-àmàm nọ, Onye nēkwurum nọ kwa n'ebe di elu.

20Ndi-eyìm bu ndi nākwam emò: Ma ọ bu n'ebe Chineke nọ ka anyam nātusisi anya-miri;

21Ka otù onye we so Chineke ruara madu uka, Dika nwa nke madu si aruara madu-ibe-ya uka.

22N'ihi na arọ ole-na-ole gābia, M'we je n'uzọ m'gaghi-alaghachi.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>