JOB 17:1-16 IGBOB1970 - Bible AI

1Emebiwo mọm, emewo ka ubọchim gwusia, Ílì dirim.

2N'ezie ikwa-emò diyerem, Anyam nānọ kwa ọnọdu-abali n'ikpasu-obi-ilu nile ha.

3Biko, do ihe-ibe, burum onye-mbe n'ebe Gi onwe-gi nọ; Ònye ka ọ bu, bú onye gānaram n'aka?

4N'ihi na I zopuwo obi-ha n'inwe ezi uche: N'ihi ya I gaghi-ebuli ha elu.

5Onye nēgosi ndi-eyì-ya inara òkè, Ọbuná anya umu-ya gādala n'isi.

6Ọzọ, O guzowom dika ilu nke ndi nile di iche iche; Onye ha nābusa ọnu-miri n'iru-ya ka m'ghọwo-kwa-ra.

7Anyam we nāhu inyoghi-inyoghi site na nkpasu-iwe, Ihe dim n'aru di ka onyinyo, ha nile.

8Ibobo bayere nka gānwu ndi ziri ezi n'aru, Onye nēmeghi ihe ọjọ gākpọte kwa onwe-ya imegide onye emeruru emeru.

9Ma onye ezi omume gējisi ike n'iso uzọ-ya, Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n'iru n'iru n'inwe ume.

10Ma otú ọ di, biko, unu nile chigharia, bia: Ma m'gaghi-achọta onye mara ihe n'etiti unu.

11Ubọchim nile agabigawo, emebiwo nzubem nile, Bú ihe-nnweta nke obim.

12Ha nēdo abali n'ọnọdu ehihie: Ha nāsi, Ìhè di nso iru ọchichiri.

13Ọ buru na elem anya ala-mọ na ọ gābu ụlọm; Ọ buru na ab͕asawom utem n'ọchichiri;

14Ọ buru na akpọwom olùlù òkù, si, Nnam ka i bu; Kpọ kwa ikpuru òkù, si, Nnem na nwa-nnem nwayi ka i bu;

15Òle ebe kwa ka olile-anyam di ub͕u a? Olile-anyam kwa, ònye gēkiri ya?

16Rue ihe di n'ala-mọ ka ha gārida, Ọ buru na izu-ike adirim otù mbe ahu n'ájá.

Bible Society of Nigeria © 1906/2006
iv>